Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 15:7 - Bible Nso

7 Otù nime ihe anọ ahu nke di ndu we nye ndi-mọ-ozi asa ahu ọkwa ọla-edo asa juputara n'ọnuma Chineke, Onye nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Otu nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 15:7
13 Iomraidhean Croise  

N'ihi na iko di n'aka Jehova, manya-vine nke di nime ya asuwo ufufu; O juputara na manya ejiri ihe gwa, O we si na nke ahu b͕aputa manya: N'ezie ọru-ala-ya nile, ndi nile n'uwa ndi nēmebi iwu gāzaputa ya ṅua.


N'ihi na otú a ka Jehova, bu Chineke nke Israel, sirim: Nara iko manya nke ọnuma nka n'akam, me ka mba nile ṅua ya, bú ndi Mu onwem nēziga gi jekuru.


N'ihi na ha onwe-ha nākọ akukọ bayere ayi aha nbata ayi batara n'ebe unu nọ; ya na otú unu siri n'arusi chigharikute Chineke, ibu orù Chineke Nke di ndu Nke bu kwa onye-ezi-okwu,


buru kwa Onye ahu nādi ndu; aghọ-kwa-ram onye nwuru anwu, ma le, anamadi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, enwe-kwa-ram nkpisi-ugodi nile nke ọnwu na nke Hedis


we were Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, bú Onye kère elu-igwe na ihe nile di ya nime, na uwa na ihe nile di ya nime, na oké osimiri na ihe nile di ya nime, ṅu iyi na oge agaghi-adi kwa ọzọ:


ya onwe-ya gāṅu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwaghi-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọku na brimstone mekpa ya aru n'iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n'iru Nwa-aturu ahu:


M'we hu ihe-iriba-ama ọzọ n'elu-igwe, nke di uku di kwa ebube, ndi-mọ-ozi asa ndi nwere ihe-ọtiti asa, nke bu nke-ikpe-azu, n'ihi na nime ha ka ọnuma Chineke gwuru.


Mọ-ozi mbu we je, wusi ọkwa-ya nime uwa; ajọ ọnyá jọb͕uru onwe-ya we puta n'aru madu nile ndi nwere akàrà anu-ọhia ahu, ndi nākpọ kwa isi ala nye ihe-oyiyi-ya.


Otù mọ-ozi n'etiti ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu we bia, we kpayerem uka, si, Biari, m'gēgosi gi ikpé nke oké nwanyi ahu nākwa iko onye nānọkwasi n'ọtutu miri;


Otù nime ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu, ndi eboro ibu ihe-otiti asa ikpe-azu, we bia; o we kpayerem uka, si, Biari, M'gēgosi gi nwanyi ahu anālu ọhu, bú nwunye Nwa-aturu ahu.


orú ndi-okenye na anọ ahu gāda n'ala n'iru Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu, ha gākpọ kwa isi ala nye Ya, bú Onye ahu Nke nādi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, ha gātudà kwa okpu-eze-ha n'iru oche-eze ahu, nāsi,


Mb͕e Ọ natara akwukwọ ahu, ihe anọ ahu nke di ndu na orú ndi-okenye na anọ ahu we da n'ala n'iru Nwa-aturu ahu, ha nile n'otù n'otù nwere ubọ-akwara, na ọkwa nke eji ọla-edo me nke juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nke bu ekpere ndi nsọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan