Mkpughe 15:4 - Bible Nso4 Ònye nāgaghi-atu egwu, Onye-nwe-ayi, to kwa aha-Gi? n'ihi na nání Gi di ọcha n'obi; n'ihi na mba nile gābia kpọ kwa isi ala n'iru Gi; n'ihi na emere ka ezi omume-Gi nile puta ìhè. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a4 Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị, onye ga-agharakwa ito aha gị? Nʼihi na ọ bụ naanị gị dị nsọ. Mba niile ga-abịakwa ịkpọ isiala nʼihu gị, nʼihi na emeela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.” Faic an caibideil |
N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu.
ọ̀ bu Mu ka unu nādighi-atu egwum? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ọ̀ gaghi-eb͕u unu nb͕u n'ihi irum? Mu onye doworo ájá ibu ókè nke oké osimiri, site n'ukpuru ebighi-ebi, ọ gaghi-agabiga kwa ya, ọ bu ezie na nmali-miri-ya nile nāmaghari, ma ha apughi; ọ bu ezie na ha nēbib͕o, ma ha adighi-agabiga ya.