Mb͕e ahu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze nọ nāchọ ichọputa ihe-ebubo iji bo Daniel bayere ala-eze; ma ọ dighi ihe-ebubo maọbu omume bibiri ebibi ọ bula ha puru ichọputa; n'ihi na onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu, ọ dighi kwa nmehie ma-ọbu omume bibiri ebibi ọ bula achọputara n'aru ya.
Ndi Israel fọduru agaghi-eme ajọ omume, ha agaghi-ekwu kwa okwu-agha; agaghi-ahu kwa ire aghughọ n'ọnu-ha: n'ihi na ndi ahu gāzù onwe-ha makpu kwa amakpu dika aturu, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji.
Iwu nke ezi-okwu di n'ọnu-ya, ahughi kwa ajọ omume n'eḅuḅere-ọnu-ya: n'udo na n'izi-ezi ka o sorom je ije, ọ di kwa ọtutu madu o mere ka ha si n'ajọ omume chigharia.
ka Ya onwe-ya we che nzukọ ahu n'iru Onwe-ya dika ihe di ebube, nēnweghi ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n'ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kwa ihe anāpughi ita uta.
ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?
N'ihi na, Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n'anya, Na ihu ezi ubọchi, Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ, Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ: