Mkpughe 13:16 - Bible Nso16 Ọ nēme kwa madu nile, ndi ntà na ndi uku, na ndi-ọgaranya na ndi-ob͕eye, na ndi nwere onwe-ha na ndi-orù, ka akà ha akàrà n'aka-nri-ha, ma-ọbu n'egedege-iru-ha; Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 O nyere iwu ka onye ọbụla, onye ukwu na onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya, nata akara nʼaka nri maọbụ nʼegedege ihu ha. Faic an caibideil |
M'we hu oche-eze, ha we nọkwasi ha, we nye ha ikpé: m'we hu nkpuru-obi nke ndi ebipururi isi n'ihi àmà Jisus, na n'ihi okwu Chineke, ndi ahu nọ kwa, bú ndi nākpọghi isi ala nye anu-ọhia ahu, ma-ọbu ihe-oyiyi-ya, ndi nānataghi kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ha na n'aka-ha; ha we di ndu, so kwa Kraist buru eze nnù arọ abua na ọgu iri.