Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 12:6 - Bible Nso

6 Nwanyi ahu we b͕alaga nime ọhia, ebe o nwere ọnọdu edoziworo site n'aka Chineke, ka ha we zùa ya n'ebe ahu nnù ubọchi atọ na ọgu atọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260).

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 12:6
10 Iomraidhean Croise  

Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke nēchere, we biarute nnù ubọchi atọ na ọgu isi na iri na ise ahu.


Mb͕e ahu ekwensu rapu Ya; ma le, ndi-mọ-ozi biakutere Ya nējere Ya ozi.


Ewe nye nwanyi ahu nkù abua ahu nke oké ugo ahu, ka o we febà n'ọhia la n'ọnọdu-ya, ebe anāzù ya otù oge, na oge abua, na nkera otù oge, ka ọ pua n'iru agwọ ahu.


Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n'ala: dragon ahu we guzo n'iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.


ewe nye ya ọnu nke nēkwu oké ihe n'ikwulu Chineke; ewe nye ya ike ime omume-ya ọgu ọnwa abua na abua.


O we bupum ba n'ọhia nime Mọ Nsọ: m'we hu nwanyi ka ọ nānọkwasi n'anu-ọhia nācha uhie uhie, nke nwere aha di iche iche juputara na nkwulu Chineke, nwe kwa isi asa na mpi iri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan