Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 12:2 - Bible Nso

2 ọ di kwa ime: o we tie nkpu, ebe ime nēme ya, anēmekpa kwa ya aru imuputa nwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ dị ime, na-etikwa mkpu nʼihi ahụhụ na ihe ụfụ nke ọmụmụ nwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 12:2
12 Iomraidhean Croise  

Dika nwayi nke di ime, nke gaje imu nwa, si ab͕ali nb͕ali, tie nkpu n'aru-ufu-ya nile; otú a ka ayi diworo n'iru Gi, Jehova.


Ihe nke sitere na ndọb͕u nkpuru-obi-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ka ọ gāhu, afọ gēju ya: ihe-ọmuma-ya ka onye ezi omume ahu, bú orùm, gēji me ka ọrà madu ghọ ndi ezi omume: ajọ omume nile ha ka ya onwe-ya gēbu kwa.


Tie nkpu ọṅù, gi nwayi-àgà, bú nwayi nāmughi nwa; tiwa nkpu ọṅù, tisi kwa nkpu ike, gi onye ime nwa nēmegh: n'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi aluru na nwunye, ka Jehova siri.


Ge nti, olu nkpọtu nēsite n'obodo, olu nēsite n'ulo uku Chineke, bú olu Jehova Onye nākwughachi ndi-iro-Ya nmeso-ha.


Ub͕u a n'ihi gini ka i nētisi nkpu ike? Ọ̀ bu na eze adighi na gi? onye-ndum-ọdu-gi, ọ lawo n'iyì, na ihe-nb͕ali ejidewo gi dika nke nwanyi ime nēme?


N'ihi nka ka Ọ gārara ha nye, rue mb͕e nwanyi ime nēme gāmuwori nwa: umu-nne-ya ndi fọduru afọdu ewe laghachikute umu Israel.


Ma ihe ndia nile bu nmalite ihe-nb͕u.


Nwanyi, mb͕e ọ bula ime nēme ya, o nwere ihe-nwuta, n'ihi na oge hour ya abiawo: ma mb͕e ọ bula ọ muputara nwa, o chetaghi ahuhu-ya ọzọ, n'ihi ọṅù-ya na amuputara madu n'uwa.


Umu-ntakirim, unu ndi ime unu nēmem ọzọ rue mb͕e agēme ka udi Kraist di nime unu,


N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ka obi nātọ gi utọ, nwanyi-àgà nke nādighi-amu nwa; Tiwa nkpu ọṅù, ti kwa nkpu, gi onye ime nādighi-eme: N'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi ahu nwere di.


Ọdudù-ya nādọrọ kwa otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nke elu-igwe, o we tudà ha n'ala: dragon ahu we guzo n'iru nwanyi ahu onye gaje imuputa nwa, ka o we ripia Nwa-ya mb͕e ọ bula ọ gāmuputa Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan