Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 11:7 - Bible Nso

7 Ma mb͕e ọ bula ha gāb͕azuwo àmà-ha, anu-ọhia ahu nke nēsi n'abyss ahu rigoputa gēbu agha megide ha, meri kwa ha, b͕u kwa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 11:7
20 Iomraidhean Croise  

Ọzọ, okwu di iche iche megide Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka o gēkwu, ọ bu kwa ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka ọ gēme ka ha ka nká: ọ gēle kwa anya ib͕anwe mb͕e di iche iche akara àkà na iwu; agēnye kwa ha n'aka-ya rue otù oge na oge abua na nkera oge.


O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n'ubọchi nke-atọ emekwam ka M'zu okè.


Ha we riọ Ya ka ọ ghara inye ha iwu ka ha je ba n'abyss.


Mu onwem nyere Gi otuto n'elu uwa, ebe M'luzuru ọlu I nyeworom ka M'lua.


Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.


Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.


Ab͕asiwom nb͕a ọma ahu, ab͕asiwom ọsọ ahu, edebesiwom okwukwe ahu:


M'gēnye kwa ndi-àmàm abua ike, ha gēbu kwa amuma nnù ubọchi atọ na ọgu atọ, eb͕okwasiwo kwa ha ákwà-nkpe.


Dragon ahu we wesa nwanyi ahu iwe, we pua ibu agha megide nkpuru-ya fọduru, bú ndi nēdebe ihe nile Chineke nyere n'iwu, ndi nēnwe kwa àmà nke Jisus:


M'we hu anu-ọhia ọzọ ka ọ nēsi n'ala rigoputa; o nwe-kwa-ra mpi abua yiri nke Nwa-aturu ahu, ma ọ nēkwu okwu dika dragon ahu.


Ewe nye ya ike ibu agha megide ndi nsọ ahu, na imeri ha: enye-kwa-ra ya ike ichi ebo nile ọ bula na ndi nile ọ bula na asusu nile ọ bula na mba nile ọ bula isi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan