Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 11:15 - Bible Nso

15 Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya, oke olu dị iche iche dara ike ike nʼeluigwe, na-asị, “Alaeze niile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 11:15
54 Iomraidhean Croise  

Jehova aṅuwo iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi Dika usoro Melkizedek si di.


Jehova gābu eze rue mb͕e ebighi-ebi, Chineke-gi, Zaion, gābu eze rue ọb͕ọ nile. Tonu Ja.


Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha, Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù, Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,


E, eze nile gākpọ isi ala nye ya: Mba nile gēfè ya òfùfè.


Bilie, Chineke, kpe uwa ikpe: N'ihi na Gi onwe-gi gēketa ihe, bú mba nile.


Mba nile ndi I meworo gābia kpọ isí ala n'iru Gi, Onye-nwe-ayi; Ha gāsọpuru kwa aha-Gi.


Jehova gābu eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agāfù opì-ike uku; ha gābia kwa, bú ndi nāla n'iyì n'ala Asiria, na ndi achusara achusa n'ala Ijipt; ha gākpọkwa isi ala nye Jehova n'ugwu nsọ ahu nime Jerusalem.


Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe, n'ihi na Jehova emewo ya; tienu nkpu, unu ebe nile di ala nke uwa; unu ugwu, tibenu nkpu ọṅù, gi oké ọhia, na osisi ọ bula di nime ya: n'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, ọ bu kwa n'Israel ka Ọ gēme Onwe-ya ka Ọ ma nma.


Le, mba nke i nāmaghi ka i gākpọ, mba nke nāmaghi gi gāb͕akute kwa gi, n'ihi Jehova, bú Chineke-gi, ọbuná n'ihi Onye Nsọ nke Israel; n'ihi na O mewo ka i ma nma.


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


Jehova, ikem, na ebem siri ike, na ebe-nb͕abàm n'ubọchi nkapab͕u, Gi ka mba nile gābiakute site na nsọtu nile nke uwa, si, Nání okwu-agha ka nna-ayi-hà ketaworo, bú ihe-efu na ihe nke ọ nadighi urù ha bara.


Ha gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyeworo orùm, bú Jekob, nke nna-unu-hà biri nime ya; ha gēbi kwa nime ya, ha onwe-ha, na umu-ha, na umu umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi: Devid, bú orùm, gābu-kwa-ra ha onye-isi rue mb͕e ebighi-ebi.


O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri; ọ bu osimiri nke m'nāpughi igabiga: n'ihi na miri ahu etowo eto, buru miri ogwugwu, osimiri nke anāgaghi-agabiga.


Ọ bu kwa ya ka enyere ọchichi, na ebube, na ala-eze, ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nile nāsu asusu di iche iche we fè Ya: ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, nke nāgaghi-agabiga, ọ bu kwa ala-eze-Ya bu nke anāgaghi-emebi.


Ma ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu gānata ala-eze ahu, nwe ala-eze ahu rue mb͕e ebighi-ebi, ọbuná rue mb͕e nile ebighi-ebi.


rue mb͕e Onye ochie ahu biara, mb͕e ọ di kwa ikpé enyere ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu: mb͕e ahu akara àkà rute-kwa-ra na ndi nsọ nwere ala-eze ahu.


Ma ala-eze ahu, na ọchichi ahu, na idi-uku nke ala-eze nile n'okpuru elu-igwe nile, ka agēnye ndi ahu, bú ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu: ala-eze-Ya bu ala-eze ebighi-ebi, ọchichi nile gēfè kwa Ya, nu olu-Ya.


M'gāgha-kwa-ra ya Onwem n'ala-ya dika nkpuru ọghigha; M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru Lo-ruhama; M'gāsi kwa Lo-ami, Ndim ka i bu; ndi ahu gāsi kwa, Chinekem.


Ndi-nzọputa gārigota kwa n'ugwu Zaion ikpe ugwu Isọ ikpe; ọ bu kwa Jehova gēnwe ala-eze ahu.


M'gēme kwa ka nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi ghọ ndi fọduru afọdu, M'gēme kwa ka nwanyi ahu nke emere ka ọ nọ n'ebe di anya ghọ mba nwere ume: Jehova gābu kwa eze-ha n'ugwu Zaion site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.


Jehova gāghọ kwa eze elu-uwa nile: n'ubọchi ahu ka Jehova gādi otù, aha-Ya gādi kwa otù.


Ọtutu mba gārapa-kwa-ra na Jehova n'ubọchi ahu, ghọ-kwa-ram otù ndi: M'gēbi kwa n'etiti gi, i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute gi.


N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ọ gēwere kwa opì uku zipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gēme kwa ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site n'otù nsọtu elu-igwe rue nsọtu-ya ọzọ.


Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.


Ọ gābu kwa eze ulo Jekob rue mb͕e ebighi-ebi; ala-eze-Ya agaghi-agwu kwa agwu.


Asim unu, na otù a ọṅù di n'iru ndi-mọ-ozi Chineke n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari.


Mb͕e ọ biaworo n'ulo, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si ha, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom aturum furu efu.


Ndi-eze uwa guzoro onwe-ha n'otù, Ndi-isi zukọ-kwa-ra, Imegide Onye-nwe-ayi, na imegide Kraist-Ya:


ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si, Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi; Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa.


ma n'ubọchi nke olu mọ-ozi nke-asa ahu, mb͕e ọ gaje ifù opì, agēme kwa ka ihe-omimi nke Chineke zu okè, dika O zìri ozi ọma nye ndi-orù-Ya, bú ndi amuma-Ya.


M'we nu oké olu ka ọ nādà n'elu-igwe, si, Ub͕u a ka ọ biaworo, bú nzọputa ahu, na ike ahu, na ala-eze Chineke-ayi, na ichi-isi nke Kraist-Ya: n'ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n'iru Chineke-ayi ehihie na abali.


Ònye nāgaghi-atu egwu, Onye-nwe-ayi, to kwa aha-Gi? n'ihi na nání Gi di ọcha n'obi; n'ihi na mba nile gābia kpọ kwa isi ala n'iru Gi; n'ihi na emere ka ezi omume-Gi nile puta ìhè.


Mọ-ozi nke-asa we wusi ọkwa-ya n'elu mbara-elu-igwe; oké olu we si n'ulo nsọ ahu daputa, si n'ebe oche-eze ahu di, nāsi, Emewo ya:


Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n'ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we nu ihe dika oké olu nke oké ìgwè ndi nọ n'elu-igwe, nāsi, Haleluya; Nzọputa nile na otuto nile na ike nile nādiri Chineke-ayi:


M'we nu ihe dika olu nke oké ìgwè ndi, di kwa ka olu ọtutu miri, di kwa ka olu éb͕è-elu-igwe di ike, nāsi, Haleluya: n'ihi na Onye-nwe-ayi Chineke-ayi, Onye puru ime ihe nile, nābu eze.


M'we hu oche-eze, ha we nọkwasi ha, we nye ha ikpé: m'we hu nkpuru-obi nke ndi ebipururi isi n'ihi àmà Jisus, na n'ihi okwu Chineke, ndi ahu nọ kwa, bú ndi nākpọghi isi ala nye anu-ọhia ahu, ma-ọbu ihe-oyiyi-ya, ndi nānataghi kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ha na n'aka-ha; ha we di ndu, so kwa Kraist buru eze nnù arọ abua na ọgu iri.


Mọ-ozi nke-anọ we fùa opì, ewe tie otù uzọ atọ nke anyanwu ihe, ya na otù uzọ n'uzọ atọ nke ọnwa, na otù uzọ n'uzọ atọ nke kpakpando nile; ka otù uzọ n'uzọ atọ nime ha we b͕a ọchichiri, ka ehihie we ghara kwa iputa ìhè n'otù uzọ n'uzọ atọ nime ya, ka ọchichiri we me kwa otú a.


Mọ-ozi nke-ise we fùa opì, m'we hu kpakpando nke sitereri n'elu-igwe da n'uwa: ewe nye ya nkpisi-ugodi nke olùlù nke abyss ahu.


Mọ-ozi nke-isi we fùa opì, m'we nu otù olu nke si na mpi nke ebe-ichu-àjà ahu eji ọla-edo me puta, bú nke di n'iru Chineke,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan