Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 11:13 - Bible Nso

13 N'otù oge hour ahu oké ala-ọma-jijiji we da, otù uzọ n'uzọ iri nke obodo ahu we da rue ala; ewe b͕ue nnù madu iri na nnù asa na ọgu iri nime ala-ọma-jijiji ahu, bú ndi nwere aha: ndi fọduru we tua egwu, ha we nye Chineke nke elu-igwe otuto.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ma nʼotu oge ahụ, nʼotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu mara nke mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ iri nke obodo ahụ niile daa. Ndị nwụrụ nʼoge ala ọma jijiji a dịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị niile fọdụrụ sitere nʼoke egwu nye Chineke nke eluigwe otuto.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 11:13
21 Iomraidhean Croise  

Nefilim nọ n'uwa na mb͕e ahu, ha nọ kwa ma emesia, mb͕e umu-ndikom nke Chineke nābakuru umu-ndinyom nke madu, mb͕e ha nāmukwara ha umu: ndi ahu bu ndi-dike ahu ndi nọri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi amara aha-ha.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēji éb͕è-elu-igwe, ji kwa ala-ọma-jijiji, na oké olu, na oké ifufe na ikuku uku, na ire-ọku nke -ọku nērichapu erichapu, leta ya.


Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n'elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri.


Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n'obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n'aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n'ihi na unu adighi-etiye ya n'obi.


Ya mere ha kpọrọ onye ahu nke ub͕ò abua, bú onye kpururi ìsì, we si ya, Nye Chineke otuto: ayi onwe-ayi matara na Nwoke a bu onye-nmhie.


Na mb͕e ahu Pita we bilie n'etiti umu-nna nime Kraist, si, (ìgwè madu ndi nọkọrọ n'otù di kwa, ihe ra ka ọgu madu isi),


Joshua we si Ekan, Nwam, biko, nye Jehova, bú Chineke Israel, nsọpuru, nye kwa Ya ekele; biko, gosikwam ihe i meworo; ezopula ya n'ebe m'nọ.


Mb͕e ubọchi atọ na nkera otù ubọchi ahu gasiri Mọ nke ndu nke si na Chineke puta we bata nime ha, ha we guzo n'ukwu-ha; oké egwu we dakwasi ndi nēkiri ha.


Ewe meghe ulo nsọ nke Chineke nke di n'elu-igwe; ewe hu ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu-Ya n'ulo nsọ Ya; àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, na ala-ọma-jijiji, na oké ákú-miri-ígwé we so.


ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n'ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile.


Ònye nāgaghi-atu egwu, Onye-nwe-ayi, to kwa aha-Gi? n'ihi na nání Gi di ọcha n'obi; n'ihi na mba nile gābia kpọ kwa isi ala n'iru Gi; n'ihi na emere ka ezi omume-Gi nile puta ìhè.


Ka ayi ṅuria ọṅu, ka obi nātọ kwa ayi utọ nke-uku, ka ayi were kwa otuto nile nye Ya: n'ihi na ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu abiawo, nwunye-Ya edoziwo kwa onwe-ya.


Ma i nwere aha ole-na-ole na Sadis ndi nēmerughi uwe-ha: ha gēsokam nējeghari nime uwe ọcha; n'ihi na ha bu ndi kwesiri.


M'we hu mb͕e Ọ saghere akàrà nke-isi, oké ala-ọma-jijiji we da; anyanwu we ghọ oji dika ákwà-nkpe nēji nji nke eji aji anu kpa, ewe me ọnwa ka ọ gbaze ka ọbara:


Mọ-ozi ahu we were ihe ahu eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpojue ya n-ọku nke sitere n'ọku nke ebe-ichu-àjà ahu, we tubà ya n'uwa: éb͕è-elu-igwe, na olu na àmùmà, na ala-ọma-jijiji we so.


Unu gēme kwa onyinyo emerod-unu, na onyinyo òké-unu nke nēbibi ala-unu; unu gēnye kwa Chineke Israel nsọpuru: eleghi anya Ọ gēme ka aka-Ya di nfé pua n'aru unu, na n'aru chi nile unu, na n'ala-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan