Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 11:12 - Bible Nso

12 Ha we nu oké olu nke si n'elu-igwe da, ka ọ nāsi ha, Rigotanu n'ebe a. Ha we rigo rue n'elu-igwe nime igwe-oji ahu; ndi-iro-ha kiri-kwa-ra ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ha nụrụ oke olu si nʼeluigwe daa na-asị, “rigotanụ nʼelu.” Ha siri nʼigwe ojii, rigoro nʼeluigwe ebe ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 11:12
21 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Jehova gaje ime ka Elaija rigorue elu-igwe n'oké ifufe, na Elaija siri na Gilgal je, ya na Elaisha.


O rue na, mb͕e ha nọ nēje, nēje ije nēkwu kwa okwu, le, ub͕ọ-ala ọku na inyinya ọku, nke kewara ha abua; Elaija we rigorue elu-igwe n'oké ifufe.


Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko we biarue Elaisha nso, si ya, Ì mawo na ta ka Jehova nēwepu onye-nwe-gi n'ibu onye-isi-gi? Ọ si, Mu onwem amawo kwa ya; b͕anu nkiti.


Ọgu ndikom abua na iri n'etiti umu ndi-amuma je-kwa-ra, guzo na ncherita-iru ha n'ebe di anya: ha abua we guzo n'akuku Jọdan.


Onye nēmebi iwu gāhu ya, ewe kpasue ya iwe; Ọ gāta ikekere-ezé, b͕aze kwa: Ọchichọ ndi nēmebi iwu nāchọsi ike gāla n'iyì.


Jehova, ònye gānọ dika ọbìa n'ulo-ikwu-Gi? Ònye gēbi n'ugwu nsọ Gi?


Ònye gārigo n'ugwu Jehova? Ònye gēguzosi kwa ike n'ebe nsọ Ya?


Merem ihe-iriba-ama bayere ezi ihe I gēmerem; Ka ndi nākpọm asì we hu ya, ka ihere we me ha, N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, eyeworom aka, kasikwam obi.


O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n'iru Israel; n'ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt.


Gi onwe-gi we si n'obi-gi, N'elu-igwe ka m'gārigo, n'elu kpakpando nile nke Chineke ka m'gēbuli oche-ezem; m'gānọkwasi kwa n'ugwu nzukọ, na nsọtu nile nke Ugwu:


ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.


Òle ndi bu ndia nke nēfe efe dika igwe-oji, ndi nēfe kwa dika nduru si eferue window-ha?


Unu gālaghachi kwa hu ihe di iche n'etiti onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'etiti onye nēfè Chineke na onye nādighi-efè Ya.


Nime Hedis o we welie anya-ya elu, ebe ọ nọ na nmekpa-aru, ọ hu Abraham n'ebe di anya, na Lazarọs ka ọ dabere n'obì-ya.


Mb͕e O kwusiri okwu ndia, mb͕e ha nēle anya, ewe welie Ya elu; igwe-oji we nara Ya, Ọ pua n'anya-ha.


mb͕e ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ na ndu, ndi anārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n'igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mb͕e nile.


O we muputa Ọkpara, bú Nwa-nwoke, Onye gēji nkpa-n'aka ígwè zù mba nile dika aturu: ewe punara ya Nwa-ya ahu la n'ebe Chineke nọ, na n'ebe oche-eze-Ya di.


Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o som nọdu ala n'oche-ezem, dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n'oche-eze-Ya.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, ọnu-uzọ ka o gheworo oghe n'elu-igwe, olu mbu m'nu-kwa-ra, olu dika nke opì nākpayerem uka, otù onye nāsi, Rigota n'ebe a, M'gēgosi kwa gi ihe nile nke nāghaghi iputa mb͕e ihe ndia gasiri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan