Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 11:10 - Bible Nso

10 Ndi bi n'elu uwa nāṅuri kwa ọṅu n'isi ha, obi nātọ kwa ha utọ; ha gēzigarita kwa onwe-ha onyinye; n'ihi na ndi-amuma abua ndia mekpara ndi bi n'elu uwa aru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ndị niile bi nʼụwa ga-aṅụrị ọṅụ, nyerịta ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nʼihi ogbugbu e gburu ndị amụma abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhụju anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 11:10
29 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Ehab huru Elaija, na Ehab siri ya, Ọ̀ bu gi bu nka, gi onye nēmekpa Israel aru?


Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n'ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


Eze Israel we si Jehoshafat, Àsighm i na ọ gaghi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ?


Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya, bú Maikaia nwa Imla: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a.


Ka onye-irom we ghara isi, Akariwom ya n'ike; Ka ndi-nkpab͕um we ghara iteghari egwú ọṅù mb͕e anēwezugam n'ọnọdum.


Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu: Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m'nēmeghi ihe b͕ue iku-anya.


I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu; I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria.


Aṅurila mb͕e onye-iro-gi nāda, Ka obi-gi ghara kwa iteghari egwú ọṅù mb͕e ọ nāsu ngọngọ:


Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n'ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n'obodo a, na aka ndi Israel nile, n'igwa ha okwu dika okwu ndia: n'ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ.


N'ihi na unu nāṅuri ọṅu, n'ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n'ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;


Ma elekwasila ubọchi nwa-nne-gi anya n'ubọchi emere ya ka ọ ghọ onye ala ọzọ, aṅu-kwa-la umu Juda n'ubọchi ila-n'iyì-ha; eme-kwa-la ka okwu-ọnu-gi di uku n'ubọchi ahuhu.


Aṅulam ọṅu, gi onye-irom: mb͕e m'dara ada, m'bilie; mb͕e m'nānọdu n'ọchichiri, Jehova gāburum ìhè.


Madu nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.


N'ezie, n'ezie, asim unu, na unu onwe-unu gēti nkpu ákwá, kwa kwa ákwá, ma uwa gāṅuri ọṅu: ọ gēwuta unu onwe-unu, ma nwuta-unu gāghọ ọṅù.


Uwa apughi ikpọ unu asì; ma ọ nākpọ Mu onwem asì, n'ihi na Mu onwem nāb͕ara ya àmà, na ọlu-ya nile jọrọ njọ.


Ma mb͕e ha nuru nka, amapue ha n'obi-ha, ha we zube ib͕u ha.


ọ dighi-aṅuri ọṅu nime ajọ omume, ma ọ nēso ezi-okwu ṅurikọ ọṅu;


Mb͕e dragon ahu huru na achudara ya-ri n'uwa, o we sob͕ue nwanyi ahu, bú nwanyi nke muputara Nwa-nwoke ahu.


O we nēduhie ndi bi n'elu uwa n'ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n'iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n'elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu.


Ndi nile ndi bi n'elu uwa gākpọ kwa isi ala nye ya, onye ọ bula anēdeghi aha-ya n'akwukwọ nke ndu nke Nwa-aturu ahu Onye eb͕uworo site n'oge itọ ntọ-ala nke uwa.


Mọ-ozi nke-ise we wusi ọkwa-ya n'elu oche-eze nke anu-ọhia ahu; ewe me ka ala-eze-ya b͕a ọchichiri; ha we tabìe ire-ha site n'aru-ufu,


N'ihi na i debere okwu nke ntachi-obim, Mu onwem gēdebe kwa gi ka i ghara ibà n'oge hour nke ọnwunwa ahu, bú oge hour nke gaje ibiakwasi elu-uwa dum madu bi, inwa ndi bi n'elu uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan