Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 9:3 - Bible Nso

3 Ma le, ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ kwuru nime onwe-ha, si, Nwoke a nēkwulu Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 9:3
13 Iomraidhean Croise  

Onye nākpọlu kwa aha Jehova, aghaghi ime ka ọ nwua; nzukọ Israel nile aghaghi itub͕u ya na nkume: dika anēme ọbìa, otú a ka agēme onye amuru n'ala, mb͕e ọ nākpọlu aha Jehova agēme ka ọ nwua.


Ma nkpuru-obi ahu nke nēwere aka npako me ihe, ma ọ bu onye amuru n'ala ma-ọbu ọbìa, Jehova ka onye ahu nēkwulu; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti ndi-ya.


Mb͕e ahu onye-isi-nchu-àjà dọwara uwe-ya nile, si, O kwuluru Chineke: ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? le, ub͕u a ka unu nuru nkwulu ahu:


n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ-ha.


Unu nuru nkwulu ahu: gini bu uche-unu? Ha nile we ma Ya ikpé, si na O kwesiri inwu ọnwu.


N'ezie asim unu, Na agāb͕aghara umu madu nmehie-ha nile, na nkwulu-ha, ka ha ra, bú nke ha gēji kwulu:


ma onye ọ bula nke gēkwulu Mọ Nsọ enweghi nb͕aghara rue mb͕e ebighi-ebi, ma nmehie ebighi-ebi nātuhi ya:


N'ihi na n'ime, bú n'obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile,


Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite itule n'obi-ha, si, Ònye bu Nwoke a nke nēkwu okwu nkwulu? Ònye puru ib͕aghara nmehie, ma-ọbughi nání Chineke?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan