Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 9:22 - Bible Nso

22 Ma Jisus chighariri, we hu ya, si, Nwam nwanyi, nwe obi-ike; okwukwe-gi azọputawo gi. Ewe site n'oge hour ahu zọputa nwanyi ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, nwee obi ike, nʼihi na e sitela nʼokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nʼoge ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 9:22
15 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ahu Jisus zara, si ya, Nwayi, okwukwe-gi di uku: ka emere gi dika i nāchọ. Ewe me ka aru di nwa-ya nwanyi ike site n'oge hour ahu.


Jisus we bara ya nba; mọ ọjọ ahu we si nime ya puta: ewe me ka aru nwa-okoro ahu di ike site n'oge hour ahu.


Jisus we si ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, Laba; dika i kwere, ka emere gi. Ewe me ka aru onye nējere ya ozi di ike n'oge hour ahu.


Ma le, ha butere Ya onye akuku-aru-ya nwuru anwu, tọb͕ọrọ n'ihe-ndina: mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, nwe obi-ike; anāb͕aghara gi nmehie-gi nile.


Mb͕e ahu O meturu anya-ha aka, si, Dika okwukwe-unu si di ka emere unu.


Jisus we si ya, Laba; okwukwe-gi azọputawo gi. Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya n'uzọ.


Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo, si n'ajọ ọria-gi nwe aru di ike.


O we si ya, Bilie, ga nke gi: okwukwe-gi azọputawo gi.


Jisus we si ya, Ka eme ka i hu uzọ: okwukwe-gi azọputawo gi.


O we si nwanyi ahu, Okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.


Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.


Ya mere nna-ya mara na ọ bu n'oge hour ahu mb͕e Jisus siri ya, Nwa-gi nwoke di ndu: ya onwe-ya we kwere na èzí-na-ulo-ya dum.


Onye a nuru Pọl ka o nēkwu: onye, ebe o legidere ya anya, ebe ọ hu-kwa-ra na o nwere okwukwe agēji zọputa ya,


Ma nka ka ọ nēme ọtutu ubọchi. Ma Pọl, ebe ike gwuru ya nọ̄, o chighariri, si mọ ahu, Anamenye gi iwu n'aha Jisus Kraist ka i si nime ya puta. O we puta n'otù oge hour ahu.


N'ihi na eziwo kwa ayi ozi ọma, ọbuná dika ezi-kwa-ra ha: ma okwu nke ha nuru abaraghi ha urù, n'ihi na ejighi okwukwe tunyere ha na ndi nuru n'ezie.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan