Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 8:26 - Bible Nso

26 O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ, unu ndi okwukwe ntà? Mb͕e ahu O biliri, bara ifufe na oké osimiri ahu nba; oké ndaju we di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Ma ọ zaghachiri, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” Mgbe ahụ o biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha niile dajụrụ, deere jii.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 8:26
24 Iomraidhean Croise  

Onye nēme ka nkpọtu oké osimiri dajua, bú nkpọtu nmali-miri-ha, Ya na ùzù nke mba nile.


Gi onwe-gi nāchi nbili-elu nke oké osimiri: Mb͕e nmali-miri-ya nile nēbuli onwe-ha elu, Gi onwe-gi nēme ka ha dajua.


Nke nēme ka ogwe-aka-Ya mara nma je ije n'aka-nri Moses? Nke nēkewa miri n'iru ha, imere Onwe-ya aha ebighi-ebi?


Ọ nābasiri oké osimiri nba ike, me ka ọ ta, ọ bu kwa osimiri nile ka O meworo ka ha takọrọ: Beshan nātalata, ya na Kamel, ihe-opupú nke Lebanon nātalata kwa.


Ọ̀ bu osimiri ka Jehova were oké iwe megide? Ọ̀ bu osimiri ka iwe-Gi nēmegide? Ma ọ̀ bu oké osimiri ka nrubiga-ókè nke iwe-Gi nēmegide? Na I nānọkwasi n'inyinya-Gi nile, N'ub͕ọ-ala-Gi nile nke bu nzọputa.


Ma ebe Jisus mara ya Ọ si, Ndi okwukwe ntà, gini mere unu nēkwurita n'etiti onwe-unu, n'ihi na unu enweghi ob͕e achicha?


O we si ha, N'ihi okwukwe ntà unu: n'ihi na n'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi ugwu a, Si n'ebe a gabiga n'ebe ahu; ọ gāgabiga kwa; ihe ọ bula agaghi-adi kwa nke unu nāpughi ime.


Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia nke ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n'ite ọku, Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà?


Ibobo we nwua ndi ahu n'aru, ha si, Àha madu gini ka Onye a bu, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?


Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta. Mb͕e mọ ọjọ ahu tudasiri ya n'ala n'etiti ha, o we si nime ya puta, nēmerughi ya aru.


o jighi kwa ekweghi-ekwe nwe obi abua n'ebe nkwa Chineke di, kama ejiri okwukwe-ya me ka o nwe ike, ọ nēnye kwa Chineke otuto,


ọ nējide kwa nwa akwukwọ ntà n'aka-ya, nke asagheworo: o we tukwasi ukwu aka-nri ya n'elu oké osimiri tukwasi kwa ukwu aka-ekpe ya n'elu ala;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan