Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 8:20 - Bible Nso

20 Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina. Ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ; ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe obibi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 8:20
35 Iomraidhean Croise  

N'akuku ha ka anu-ufe nke elu-igwe bi, Ha nēsi n'etiti alaka-osisi me ka olu-ha da udà.


Ebe umu-nnunu na-akù akwú: Ub͕ala, osisi fir bu ulo-ya.


N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu, Adupuwo kwa nkpuru-obim nimem.


Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na ob͕eye; Ma Onye-nwe-ayi nēchèrem èchìchè: Onye-iye-akam na Onye nēme ka m'b͕apu ka I bu; Chimekem, anọla ọdù.


Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye ihe nēb͕u nb͕u: Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n'ebe di elu.


Ọbuná nnunu di ntà achọtawo ulo, Eléké achọtawo-kwa-ra onwe-ya akwu, ebe o tiyeworo umu-ya Bú ebe-ichu-àjà-Gi nile, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ezem na Chinekem.


Anọm nāhu n'ọhù nile nke abali, ma, le, otù onye, nke di ka nwa nke madu, nọ nābia n'igwe-oji nke elu-igwe, ọ bu kwa Onye ochie ahu ka ọ biakutere, ha we me ka ọ biarue nso n'iru Ya.


Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya; ma onye ọ bula nke gēkwu megide Mọ Nsọ, agaghi-ab͕aghara ya, ọ bughi n'oge a, ọ bughi kwa n'oge nke gaje ibia.


n'ihi na dika Jona nọrọ ubọchi atọ ehihie na abali n'afọ oké anu miri; otú a Nwa nke madu gānọ n'obi nke ala ubọchi atọ ehihie na abali.


N'ihi na Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.


O we za, si, Onye nāgha nkpuru ọma ahu bu Nwa nke madu;


Ma mb͕e Jisus biara n'akuku Sisaria Filipi, Ọ jua ndi nēso uzọ-Ya, si, Ònye ka madu nāsi na Nwa nke madu bu?


N'ihi na Nwa nke madu gaje ibia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi-Ya; mb͕e ahu ka Ọ gēnyeghachi kwa onye ọ bula dika omume-ya si di.


Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, Jisus we nye ha iwu, si, Unu agwala onye ọ bula ihe unu huru, rue mb͕e Nwa nke madu gēsi na ndi nwuru anwu bilie.


Jisus we si ha, N'ezie asim unu, na unu onwe-unu ndi sorom, n'imu-ọzọ ahu, mb͕e ọ bula Nwa nke madu gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya, unu onwe-unu gānọkwasi kwa n'oche-eze iri na abua, nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé.


N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme n'ọb͕ọ a nke nākwa iko, nke nēmehie kwa, ihere onye ahu gēme kwa Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi mọ-ozi-Ya di nsọ.


Ma asim unu, Onye ọ bula nke gēkwuputam n'iru madu, ya ka Nwa nke madu gēkwuputa kwa n'iru ndi-mọ-ozi nke Chineke:


Asim unu, na Ọ gēkpeputa ha ọsọsọ. Otú ọ di, mb͕e Nwa nke madu gābia, Ọ̀ gāhu okwukwe n'elu uwa?


Nka gābu-kwa-ra unu ihe-iriba-ama-Ya; Unu gāhu Nwa ọhu ekere n'ákwà ọkiké, nēdina kwa n'ihe anētiye nri anu-ulo.


Ha we were ọsọ bia, hu Meri na Josef, na Nwa ọhu ahu ka O dinara n'ihe ahu anētiye nri anu-ulo.


O we muta Nwa-nwoke mbu ya; o we ke Ya n'ákwà ọkiké, nyibe Ya n'ihe anētiye nri anu-ulo, n'ihi na uzọ adighi nye ha n'ulo ndi-ije.


Ma murunu anya n'oge ọ bula, nāriọ aririọ, ka unu we nwe ike ib͕anari ihe nile ndia nke gaje ime, na iguzo n'iru Nwa nke madu.


na Joana nwunye Kuza onye Herod tiyere ihe-ya n'aka, na Susana, na ọtutu ndi ọzọ, ndi nēweputa ihe ha nwere ime ezi ha.


Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.


Ọ si kwa ya, N'ezie, asim unu, Unu gāhu elu-igwe ka emegheworo ya, hu kwa ndi-mọ-ozi nke Chineke ka ha nārigo nārida kwa n'aru Nwa nke madu.


Ya mere ìgwè madu ahu zara Ya, si, Ayi onwe-ayi nuru site n'iwu-ayi na Kraist-ayi nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi: Gì onwe-gi si kwa aṅa si, Aghaghi iweli Nwa nke madu elu? Ònye bu Nwa nke madu a?


Ya mere mb͕e ọ pururi, Jisus si, Ub͕u a ka enyere Nwa nke madu otuto, enye-kwa-ra Chineke otuto nime Ya;


Ọ dighi kwa onye ọ bula rigoworo n'elu-igwe, ma-ọbughi Onye siri n'elu-igwe ridata, bú Nwa nke madu.


Ma dika Moses weliri agwọ n'ọhia, ọbuná otú a aghaghi iweli Nwa nke madu elu:


Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà.


Ya mere Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na unu erighi anu-aru nke Nwa nke madu, ọ buru kwa na unu aṅughi ọbara-Ya, unu enweghi ndu nime onwe-unu.


Ùnu agaghi-amakari kwa n'ọnyà ma ọ buru na unu ahu Nwa nke madu ka Ọ nārigo n'ebe Ọ nọri na mbu?


o we si, Le, anamahu elu-igwe ka emegheworo ha, na Nwa nke madu ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke.


N'ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n'ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan