Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 8:17 - Bible Nso

17 ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si, Ya onwe-ya nara nriaria nile ayi, būru kwa ọria nile ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Nke a bụ imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “O bupụrụ nrịa nrịa anyị niile, burukwa ọrịa anyị niile.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 8:17
9 Iomraidhean Croise  

Abraham we were nkú àjà-nsure-ọku, bo Aisak nwa-ya nwoke; o jide n'aka-ya ọku na mma; ha abua we yikọ je.


N'ezie ọria nile nke ayi ka ya onwe-ya bupuworo, ihe-nb͕u nile nke ayi kwa, o buruwo ha; ma ayi onwe-ayi guru ya n'onye etiworo ihe-otiti, onye Chineke tiworo ihe, na onye ewedara n'ala.


Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si,


O we nọ n'ebe ahu rue ọnwu Herod: ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si, Site n'Ijipt ka M'kpọputara Nwam.


we bia biri n'obodo anākpọ Nazaret: ka okwu ekwuru site n'ọnu ndi-amuma we mezu, na agākpọ Ya Onye Nazaret.


Ma mb͕e o ruru anyasi, mb͕e anyanwu dara, ha nēkutara Ya ndi aru nādighi nma, na ndi mọ ọjọ ji


Ma mb͕e anyanwu nāda, ndi nile, ka ha ra, bú ndi nwere madu aru nādighi nma n'ọria di iche iche, kuru ha biakute Ya; O we bikwasi ha nile n'otù n'otù aka-Ya abua, me kwa ka aru di ha ike.


N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike.


Onye Ya onwe-ya, dika àjà achuru, būru nmehie nile ayi n'aru-Ya n'elu osisi ahu, ka ayi, ebe ayi nwuworo n'ebe nmehie nile di, ka ayi we di ndu n'ebe ezi omume di; Onye eji ọnyá-utari-Ya me ka unu nwe ezi ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan