Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 7:28 - Bible Nso

28 O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia, ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n'aru:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a, ozizi ya juru igwe mmadụ ahụ niile anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 7:28
18 Iomraidhean Croise  

Emewo gi ka i ma nma kari umu madu; Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua: N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi.


O rue, mb͕e Jisus nyebìri ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya iwu, O si n'ebe ahu pua izí ihe na ikwusa n'obodo nile ha.


O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia, O si na Galili zọlie, bia n'ókè-ala Judia n'ofè Jọdan;


Ma mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ibobo ozizí-Ya nwuru ha n'aru.


O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia nile, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,


miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we tikwasi ulo ahu; o we da: ọdida-ya di kwa uku.


n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ-ha.


Ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru: n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike, ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ.


Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nu ya, ha we nāchọ uzọ ha gēsi la Ya n'iyì: n'ihi na ha nātu egwu Ya, n'ihi na ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n'aru.


Mb͕e ubọchi-izu-ike ruru, O we malite izi ihe n'ulo-nzukọ-ha: mb͕e ha nuru Ya ibobo we nwua ọra madu n'aru, ha si, Òle ebe ka Nwoke a nwere ihe ndia? ha si kwa, Gini bu amam-ihe enyere Nwoke a? òle isi ọlu ike di otú a aluru n'aka-Ya?


ha ahughi kwa ihe ha gēme; n'ihi na ndi-Ju nile nọ Ya nso gburugburu, nānu okwu-Ya.


ibobo nghọta-Ya na ọziza nile Ya we nwua ndi nile nuru okwu-Ya n'aru.


Ha nile we buru ndi-àmà-Ya, okwu nile nke amara nke si n'ọnu-Ya puta nēju kwa ha nile anya: ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Nwa Josef?


ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru; n'ihi na okwu-Ya di ike.


Mb͕e O kwubìri okwu-Ya nile na nti ndi-Ju, O we ba na Kapanaum.


Ya mere o nēju ndi-Ju anya, ha si, Onye a, Ò si aṅa mata akwukwọ ri nne, n'ebe ọ dighi mb͕e Ọ muworo akwukwọ?


Ndi ahu ndi nēje ozi zara, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula madu kwuru okwu di otú a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan