Menu osisi ka ọ di nma, menu nkpuru-ya ka ọ di kwa nma; ma-ọbu menu osisi ka ọ buru osisi nābaghi n'ihe, menu nkpuru-ya ka ọ buru kwa nkpuru nābaghi n'ihe: n'ihi na amara osisi site na nkpuru-ya.
N'ihi na amara osisi ọ bula site na nkpuru nke aka ya. N'ihi na madu adighi-ekpokọta mkpuru fig site n'ogwu, ha adighi-aghọta kwa nkpuru-vine site n'obi-ogwu.