Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 7:14 - Bible Nso

14 N'ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ole na ole na-achọta ụzọ ahụ na-eduba na ndụ, nʼihi na ọ dị warawara, dịkwa nkpagide.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 7:14
27 Iomraidhean Croise  

I gēme ka m'mara uzọ ndu: Ojuju-afọ ọṅù di n'iru Gi; E! utọ di iche iche di n'aka-nri-Gi ebighi-ebi.


N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije, N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé:


nti-gi abua gānu kwa okwu n'azu-gi, si, Nka bu uzọ, jenu ije nime ya; mb͕e unu nēche iru n'aka-nri, na mb͕e unu nēche iru n'aka-ekpe.


Uzọ atuliri atuli, ọbuná uzọ, gādi kwa n'ebe ahu, Uzọ nke idi-nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru árú agaghi-agabiga na ya; ma uzọ ahu gādiri ndi ahu: onye ọ bula nke nāga n'uzọ, ọbuná ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ha agaghi-akpafu akpafu.


Ọ gāsi kwa, Tulienu, tulienu, dozienu uzọ, bupunu ihe-isu-ngọngọ n'uzọ ndim.


Otú a ka Jehova siri, Guzonu n'uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya.


Otú a ndi-ikpe-azu gēbu uzọ, ndi bu uzọ gābu kwa ndi-ikpe-azu.


N'ihi na ndi akpọworo di ọtutu, ma ndi arọputaworo di ole-na -ole.


Sinu n'ọnu-uzọ di warara bà: n'ihi na obosara ka ọnu-uzọ ahu di, mbara ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà n'ila-n'iyì, ọtutu ka ha di kwa, bú ndi nēsi na ya nābà.


Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n'ihe-oyiyi aturu, ma n'ime ha bu agu nāpunara aturu.


O we kpọ ìgwè madu ahu, ha na ndi nēso uzọ-Ya, ka ha biakute Ya, Ọ si ha, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam.


Atula egwu, ìgwè aturu ntà; n'ihi na ọ di Nna-unu ezi nma inye unu ala-eze-Ya.


Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.


Okwu ndia ka M'gwaworo unu, ka unu we nwe udo nimem. N'uwa unu nēnwe nkpab͕u: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa.


nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke.


Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè.


N'ìhi gini? N'ihi na ha esiteghi n'okwukwe chọ ya, kama dika agāsi na ha sitere n'ọlu chọ ya. Ha suru ngọngọ na nkume nke isu-ngọngọ-ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan