Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 6:6 - Bible Nso

6 Ma gi onwe-gi, mb͕e ọ bula i nēkpe ekpere, bà n'ime-ulo ntà gi, mb͕e i mechisi-kwa-ra uzọ-gi, kpere Nna-gi Nke di na nzuzo, Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 6:6
17 Iomraidhean Croise  

O we ba, mechibido ha abua uzọ kpere Jehova.


Anya abua nke Jehova di n'aru ndi ezi omume, Nti-Ya abua ghe-kwa-ra oghe na nkpu ha nētiku Ya.


N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya, Jehova gākwughachi kwa gi.


Bia, ndim, bata n'ime-ulo-gí nile, mechibido uzọ-gi nile n'azu-gi: zobe onwe-gi nání otù ntabi-anya ntà, rue mb͕e oké iwe gāgabiga.


O gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mb͕e ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu.


Mb͕e O zilagasiri ìgwè madu nile, Ọ rigoro n'elu ugwu ahu iche ikpe ekpere: ma mb͕e o ruru anyasi, nání Ya nọ n'ebe ahu.


ka i ghara igosi madu onwe-gi na i nēbu ọnu, kama gosi Nna-gi Nke di na nzuzo: Nna-gi, Nke nāhu ihe na nzuzo, gēnyeghachi kwa gi.


ka ọlu ebere gi we di na nzuzo: Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi.


Nataniel si Ya, Òle ebe I maram? Jisus zara, si ya, Mb͕e Filip akākpọghi gi, mb͕e i nọ n'okpuru osisi fig, ahurum gi.


Jisus si ya, Emetulam aka; n'ihi na akāmarigogh lakuru Nnam: ma gakwuru umu-nnam, si ha, Anamarigo lakuru Nnam na Nna-unu, na Chinekem na Chineke-unu.


Kọniliọs we si, Ubọchi anọ gara aga, rue oge hour nka, m'nēkpe ekpere n'oge hour nke-iteghete n'ulom; ma le, otù nwoke guzoro n'irum n'uwe nēnwu enwu,


Ma n'echi-ya, mb͕e ndi ahu nọ n'ije-ha, nābiaru kwa obodo ahu nso, Pita rigoro n'elu ulo ikpe ekpere, n'ihe ra ka oge hour nke-isi:


Ma Pita chupuru ha nile n'èzí, we b͕ue ikperè n'ala, kpe ekpere; o we chigharia n'ebe ozu ahu di, si, Tabita, bilie. Nwanyi ahu we saghe anya-ya; mb͕e ọ huru Pita, o we nọlie.


N'ihi na ndi di ka anu-aru si chọ nātukwasi uche n'ihe nke anu-aru; ma ndi di ka Mọ Nsọ si chọ nātukwasi uche n'ihe nke Mọ Nsọ.


Ọ bu n'ihi nka ka m'ji b͕ue ikperèm abua n'ala nye Nna-ayi,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan