Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 6:16 - Bible Nso

16 Ọzọ, mb͕e ọ bula unu nēbu ọnu, unu aghọla ndi nāb͕aru iru, dika ndi-iru-abua: n'ihi na ha nēmebi iru-ha, ka ha were onwe-ha gosi madu na ha nēbu ọnu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 6:16
25 Iomraidhean Croise  

Devid we riosie Chineke aririọ ike bayere nwata ahu; Devid we nēbu ọnu, ba nime, dina ala ogologo abali nile.


Ndi-orù-ya we si ya, Gini bu ihe a nke i meworo? ọ bu n'ihi nwa ahu, mb͕e ọ nọ na ndu, ka i būru ọnu, kwa ákwá; ma mb͕e nwa ahu nwuru, i biliri rie nri.


O rue, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, na ọ dọwara uwe-ya nile, tukwasi ákwà-nkpe n'anu-aru-ya, bue ọnu, dina n'ákwà-nkpe, jegharia nwayọ.


O rue, mb͕e m'nuru okwu ndia, na anọdurum ala, kwa ákwá, rue újú ubọchi ufọdu; m'we bue ọnu, kpe kwa ekpere n'iru Chineke nke elu-igwe,


Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n'uzọ di otú a ka m'gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n'iyì, alawom n'iyì.


Ikperè-ukwum abua asuwo ngọngọ site n'obubu-ọnu; Anu-arum nāta aru nēnweghi abuba.


Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe: Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu; Ekperem nālaghachikute kwa obim.


M'we kwa ákwá n'obubu-ọnu nke nkpuru-obim, O we ghọrọm nání ihe-ita-uta.


M'we che Onye-nwe-ayi Chineke irum, ichọ Ya n'ekpere na aririọ-amara di iche iche, n'obubu-ọnu na ákwà-nkpe na ntu.


Unu asiwo, Ọ bu ihe-efu ifè Chineke òfùfè: ọ̀ bu kwa urù gini ka ọ bara ayi na ayi edebewo ihe-ndebe-Ya, na ayi ejeghariwo kwa n'uwe-iḅa-nkpe n'iru Jehova nke usu nile nke ndi-agha?


Lezienu anya ka unu ghara ime ezi omume-unu n'iru madu, ka ha we kiri unu: ma unu emeghi otú a unu enweghi ugwọ-ọlu n'ebe Nna-unu Nke bi n'elu-igwe nọ.


Ya mere, mb͕e ọ bula i nālu ọlu ebere, afùla opì n'iru gi, ọbuná dika ndi-iru-abua nēme n'ulo-nzukọ-unu na n'uzọ-unu, ka ha we nara otuto n'aka madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.


Mb͕e ọ bula unu nēkpe kwa ekpere, unu agaghi-adi ka ndi-iru-abua ahu: n'ihi na ọ nātọ ha utọ iguzo n'ulo-nzukọ-unu na nkuku amá-unu ikpe ekpere, ka ha we were onwe-ha gosi madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.


Ndi nēso uzọ Jọn na ndi-Farisi nēbu kwa ọnu: ha we bia, si Ya, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ Jọn na ndi nēso uzọ ndi-Farisi nebu ọnu, ma ndi nēso uzọ-Gi adighi-ebu ọnu?


Anamebu ọnu ub͕ò abua n'ízù ubọchi asa; anamenye otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile, ka ha ra, bú nke m'natara.


o we nọdu n'ọnọdu nwanyi di-ya nwuru rue ọgu arọ anọ na anọ), onye nāpughi n'ulo Chineke, ma o were obubu-ọnu na aririọ nēkpere Chineke abali na ehihie.


Kọniliọs we si, Ubọchi anọ gara aga, rue oge hour nka, m'nēkpe ekpere n'oge hour nke-iteghete n'ulom; ma le, otù nwoke guzoro n'irum n'uwe nēnwu enwu,


Mb͕e ha rọputasiri ndi-okenye nime nzukọ Kraist nile n'otù n'otù nye ha, were kwa ọbubu-ọnu kpe ekpere, ha we rara ha nye n'aka Onye-nwe-ayi, bú Onye ha kwereri na Ya.


Unu emeb͕ula onwe-unu, ma-ọbughi ma eleghi anya unu gēsite n'inwe otù olu me ya na nwa oge, ka unu we nwe oghere ikpe ekpere, we nọkọ kwa ọzọ, ka Setan we ghara inwa unu n'ihi na unu apughi ijide onwe-unu.


n'idọb͕u onwem n'ọlu na ihuju-anya, n'imu-anya ọtutu mb͕e, n'oké agu na akpiri-ikpọ-nku, n'obubu-ọnu ọtutu mb͕e, n'oyi na ib͕a-ọtọ.


nime ihe-otiti, nime ulo-nkpọrọ, nime aghara, nime idọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nime imuru-anya, nime obubu-ọnu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan