Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 5:44 - Bible Nso

44 ma Mu onwem si unu, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsob͕u unu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

44 Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 5:44
21 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Etib͕ula ha: ì gētib͕u ndi i wereworo mma-agha-gi, were kwa uta-gi, dọta n'agha? dọba nri na miri n'iru ha, ka ha we rie, ṅu kwa, lakuru onye-nwe-ha.


Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ; (Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:)


Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ; Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.


Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà.


Iwu ọhu M'nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n'anya; dika M'huru unu n'anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n'anya.


Ma Pọl were oké olu ti nkpu, si, Emerula onwe-gi aru: n'ihi na ayi nile nọ n'ebe a.


O we b͕u ikperè n'ala, were kwa oké olu ti nkpu, si, Onye-nwe-ayi, atukwasila nmehie a n'isi-ha. Mb͕e o kwusiri okwu a, o we da n'ura.


Nāgọzinu ndi nēsob͕u unu; nāgọzinu, abu-kwa-la ha ọnu.


Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ.


Onye, mb͕e anēkwuto Ya, Ọ dighi-ekwutọghachi ọzọ; mb͕e Ọ nāhu ahuhu, Ọ dighi-aba nba; kama Ọ rara Onwe-ya nye n'aka Onye ahu Nke nēkpe ikpé ziri ezi:


ndi nādighi-ewere ihe ọjọ nyeghachi n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu nkwutọ n'ọnọdu nkwutọ; ma kama nke ahu burunu ndi nāgọzi; n'ihi na ihe eji kpọ unu bu nka, ka unu we keta ngọzi.


Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n'ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan