Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 4:4 - Bible Nso

4 Ma Ọ zara, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu okwu nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Chineke puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ma Jisọs zara, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 4:4
26 Iomraidhean Croise  

Umu Israel we hu ya, sirita onwe-ha, Gini ka ọ bu? n'ihi na ha amaghi ihe ọ bu. Moses si ha, Nke ahu bu nri nke Jehova nyeworo unu ka unu rie.


Umu Israel we rie manna ahu ọgu arọ abua, rue mb͕e ha batara n'ala ebí ebí; manna ahu ka ha riri, rue mb͕e ha batara na nsọtu ala Kenean.


Moses we si, Nka gābu mb͕e Jehova gēnye unu anu n'anyasi ka unu rie, mb͕e Ọ gēnye kwa unu nri n'ututu ka unu riju afọ; ebe Jehova nānu ntamu unu onwe-unu nātamu megide Ya: ma àyi onwe-ayi bu gini? ha abughi imegide ayi, bú ntamu unu nātamu, kama imegide Jehova.


I gēdebe ememe achicha ekoghi-eko: ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M'nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n'ọnwa Ebib (n'ihi na ọ bu nime ya ka i siri n'Ijipt puta); ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka:


Ọ bughi ihe nābà n'ọnu nēmeru madu; kama ihe si n'ọnu puta, ọ bu nke ahu nēmeru madu.


Mb͕e ahu Jisus siri ya, Laba, Setan: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.


Jisus siri ya, Ọzọ kwa edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.


O we si, Ihe nke si nime madu puta, nke ahu nēmeru madu.


Jisus we za, si ya, Ekwuwo, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.


Jisus we za ya, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu.


Jisus we za, si ya, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.


Ma mb͕e ọ bula Onye-nkasi-obi ahu gābia, Onye Mu onwem gēsi n'ebe Nnam nọ zitere unu, bú Mọ nke ezi-okwu, Onye si na Nnam puta, Onye ahu gāb͕aram àmà:


Ọ bu Mọ nēme ka madu di ndu; anu-aru abaghi urù ọ bula: okwu nke Mu onwem gwaworo unu, ha bu mọ, buru kwa ndu.


N'ihi na ka ha ra, bú ihe edere n'akwukwọ nsọ n'oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ nwe olile-anya.


Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke:


O we weda gi n'ala, me ka agu gua gi, O we me ka i rie manna ahu, nke i nāmaghi, nke nna-gi-hà nāmaghi kwa; ka O we me ka i mara na ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu ihe nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Jehova puta ka madu gēji di ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan