Matiu 4:24 - Bible Nso24 Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a24 Akụkọ banyere ya gbasara jezuo akụkụ Siria niile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha niile. Faic an caibideil |
Ma ewerewom ikem nile doziere ulo Chinekem ọla-edo iji me ihe ọla-edo, na ọla-ọcha iji me ihe ọla-ọcha, na ọla iji me ihe ọla, na ígwè iji me ihe ígwè, na osisi iji me ihe osisi; na nkume onyx, na nkume nhiọgide, na nkume ichọ-nma, na nke turu agwa, na nkume nile di oké ọnu-ahia, na nkume marble n'uba.
si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.