Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 4:16 - Bible Nso

16 Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiri Huru oké ìhè, Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu, Ndia ka ìhè walitere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 ndị nọ nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 4:16
14 Iomraidhean Croise  

Ala oké ọchichiri, dika oké ọchichiri onwe-ya; Ala onyinyo ọnwu, nke usoro nādighi ya, Ebe ọmumu-ìhè di kwa ka oké ọchichiri.


Ka ọchichiri na onyinyo ọnwu b͕aputa ya; Ka igwe-oji biri n'elu ya; Ka ihe nile nke nēme ka ubọchi b͕a ọchichiri me ka ọ tua egwu nke-uku.


Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di, Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha.


Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia, Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi.


N'ihi ha ọ dighi nb͕achi gādiri nwanyi nke nkpà kpara. Na mb͕e mbu O mere ka elelia ala Zebulun na ala Naftali, ma na mb͕e ikpe-azu ka O meworo ka asọpuru ya, n'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan, Galili nke mba nile.


Ndi nējeghari n'ọchichiri huru ìhè uku: ndi bi n'ala onyinyo ọnwu, ìhè amukwasiwo ha.


Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n'elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri.


chọnu Onye nēme Pleiades na Orion, Nke nāb͕anwe onyinyo ọnwu ka ọ ghọ ututu, Nke nēme kwa ka ehihie b͕a ọchichiri dika abali; Onye ahu Nke nākpọ miri nke oké osimiri òkù, we wusa ha ala; Jehova bu aha-Ya;


Aṅulam ọṅu, gi onye-irom: mb͕e m'dara ada, m'bilie; mb͕e m'nānọdu n'ọchichiri, Jehova gāburum ìhè.


Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ, Na ebube ndi-Gi, bú Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan