Ọ gēru kwa, mb͕e mu onwem si n'ebe i nọ je, na Mọ nke Jehova gēburu gi jerue ebe m'nāmaghi; ma mb͕e m'biara igosi Ehab, ma ọ chọtaghi gi, ọ gēb͕ukwam: ma orù-gi nātu egwu Jehova site na mb͕e m'di na nwata.
Ha we si ya, Biko, le, ọgu ndikom abua na iri, bú ndi-dìnkpà, nọ n'etiti ndi-orù-gi n'ebe a; biko, ka ha je, chọ onye-nwe-gi: eleghi anya Mọ nke Jehova eweliwo ya, tuda ya n'otù ugwu, ma-ọbu n'otù ndagwurugwu. Ọ si, Unu ezigala.
Mọ Chineke we buliem, me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova, nke nēche iru n'Iru-anyanwu: ma, le, n'oghere nke ọnu-uzọ-ama ahu ka orú ndikom na ise nọ; m'we hu n'etiti ha Jeazanaia nwa Azua, na Pelataia nwa Benaia, bú ndi-isi nke ndi Israel.
Ma Mọ Chineke bulirim, me ka m'bata na Kaldea biakute ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, n'ọhuhu-ihe ahu nime Mọ Chineke. Ọhuhu-ihe ahu nke m'hururi we si n'ebe m'nọ rigo.
N'ọhù di iche iche nke Chineke ka O mere ka m'bata n'ala Israel, Ọ dọbam n'ugwu di elu nke-uku, nke ihe dika obodo anēwu ewu di n'elu ya n'akuku Ndida.
O we setipu udi aka madu, jidem n'agiri-isi nke isim; Mọ Chineke we buliem elu n'etiti ala na elu-igwe, me ka m'bata Jerusalem n'ọhù nke Chineke, rue oghere nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche Ugwu iru; ebe ọnọdu ihe-oyiyi nke ekworo di, bú nke nākpasu ekworo.