Ma ub͕u a menu ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma, ge-kwa-nu nti olu Jehova, bú Chineke-unu; Jehova gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke O kwuworo megide unu.
Eleghi anya ulo Juda gānu ihe ọjọ ahu nile nke Mu onwem nēchè ime ha; ka ha we lata, onye o bula o si n'uzọ ọjọ ya lata; ka M'we b͕aghara ajọ omume-ha na nmehie-ha.
N'ihi na Jọn biakutere unu n'uzọ ezi omume, ma unu ekweghi ya: ma ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko kwere ya: ma mb͕e unu huru ya, unu onwe-unu akwaghi uta ọbuná emesia, ka unu we kwere ya.
Ya mere mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu, unu amalite-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.
kama eburum uzọ kọrọ ndi bi na Damaskọs akukọ, kọ kwa na Jerusalem, na nime ala Judia nile, kọ-kwa-ra ndi mba ọzọ, ka ha chègharia chigharikute kwa Chineke, nālu ọlu kwesiri nchèghari.