Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 3:16 - Bible Nso

16 Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ngwangwa e mechara Jisọs baptizim, o sitere na mmiri ahụ rịpụta. Nʼotu oge ahụ, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ nke Chineke ka o si nʼelu fedata dị ka nduru na-ebekwasị Jisọs nʼisi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 3:16
14 Iomraidhean Croise  

Mọ nke Jehova gēnwe kwa ọnọdu-Ya n'aru ya, bú Mọ nke amam-ihe na nghọta, Mọ nke ndum-ọdu na idi-ike, Mọ nke ihe-ọmuma na egwu Jehova;


Le orùm, onye M'nējide aka; onye nkem M'rọputara, onye ihe-ya tọrọ nkpuru-obim utọ: atukwasiwom ya Mọm; ikpé ka ọ gēweputara mba nile.o


Ma Mu onwem, nka bu ọb͕ub͕a-ndum nke di n'etiti Mu na ha, ka Jehova siri: Mọm nke di n'aru gi, na okwum nile nke M'tiyeworo n'ọnu-gi, agaghi-apu n'ọnu-gi, na n'ọnu nkpuru-gi, na n'ọnu nkpuru nke nkpuru-gi, ka Jehova siri, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.


Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n'arum; n'ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n'ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u;


O rue, n'arọ nke-orú-na-iri, n'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nọ n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ n'akuku osimiri Keba, na emeghere elu-igwe, m'we hu ọhù di iche iche nke Chineke.


Ngwa ngwa mb͕e O si na miri nārigo, Ọ huru elu-igwe ka ha nādọwa, Ọ hu-kwa-ra Mọ Nsọ dika nduru ka Ọ nēfedakwasi Ya:


Ọ si kwa ya, N'ezie, asim unu, Unu gāhu elu-igwe ka emegheworo ya, hu kwa ndi-mọ-ozi nke Chineke ka ha nārigo nārida kwa n'aru Nwa nke madu.


N'ihi na Onye ahu Chineke zitere nēkwu okwu Chineke: n'ihi na O siteghi n'ọtùtù enye Mọ Nsọ.


nāmalite na baptism nke Jọn, rue ubọchi anapuru Ya n'ebe ayi nọ rigo n'elu-igwe, otù onye nime ndia aghaghi iso ayi buru onye-àmà nke nbilite- n'ọnwu-Ya.


o we si, Le, anamahu elu-igwe ka emegheworo ha, na Nwa nke madu ka Ọ nēguzo n'aka-nri Chineke.


Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan