Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 3:12 - Bible Nso

12 Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, Ọ gāfuchapu kwa ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, Ọ gēkpokọta kwa ọka-Ya n'ọba-Ya, ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ihe ịfụcha ọka ya dị ya nʼaka, ọ ga-azacha ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, chịkọta mkpụrụ ọka wiiti tinye ha nʼọba, ma jiri ọkụ a na-apụghị imenyụ emenyụ rechapụ igbugbo ọka.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 3:12
30 Iomraidhean Croise  

Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe, Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?


Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di; Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa.


Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.


Ọgaranya gāghọ kwa eriri-nzuzu, ọlu-ya gāghọ kwa icheke-ọku; ha abua gēre kwa ọku n'otù, ọ dighi kwa onye nēmenyu ha.


Mba di iche iche, dika nkpọtu nke miri di ike ka ha nākpọtu: ma Ọ nābasiri ya nba ike, o we b͕alaga n'ebe di anya, anāchi kwa ya dika ib͕ob͕o-ọka nke ugwu n'iru ifufe, na dika ihe anēfeghari buruburu n'iru oké ifufe.


Ọnuma adighi nimem: ọ gādim nọ̄ nma ma ogwu na uke gēmegidem n'agha! M'gāwaku ha, M'gēsurekọta ha n'otù.


Ànāsupia ọka eji eme achicha? é-è, n'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ ganāzọchasi ya ike, me ka wheel nke ub͕ọ-ala-ya na inyinya-ya nile gagharia n'elu-ya; ọ dighi-asupia ya.


Ehi kwa na umu-inyinya-ibu nālu ubi gāta nri agwara agwa nke nnú di ya, nke ejiworo osekè na ihe-ifucha-ọka fucha ya.


I gāfucha ha, ifufe gēfepu kwa ha, oké ifufe gēfesa kwa ha: ma gi onwe-gi gēteghari egwú ọṅù na Jehova, n'Onye Nsọ nke Israel ka i gānya isi.


N'ihi nka dika ire ọku si erichapu ahihia-ọka, na dika ahihia nke kpọrọ nku si ada n'ọku nēnwu enwu, otú a nkpọrọgwu-ha gādi ka ihe nēre ure, ifuru-ha gāla kwa elu dika uzuzu: n'ihi na ha ajuwo iwu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu kwa okwu-ọnu nke Onye Nsọ nke Israel ka ha lelìworo.


Ha gāpu kwa, lekwasi ozu nile nke ndi nējehie ejehie megidem: n'ihi na ikpuru-ha agaghi-anwu, ọku-ha agaghi-anyu kwa; ha gābu-kwa-ra anu-aru nile ihe isọ oyi.


M'we were ihe-nfucha fucha ha n'ọnu-uzọ-ama nke ala nka; ab͕abawom ha aka umu, emewom ka ndim la n'iyì; ha esighi n'uzọ nile ha lata.


Ma ọ buru na unu egeghm nti ido ubọchi-izu-ike nsọ, na ighara ibū ibu bata n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem n'ubọchi-izu-ike; M'gēsuye kwa ọku n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, ọ gērichapu kwa ulo-elu nile nke Jerusalem, agaghi-emenyu kwa ya.


Na mb͕e ahu ka agāsi ndi nka, si kwa Jerusalem, Ifufe di ọku, nke sitere n'ebe di elu nke ọhia nādighi ya nke di n'ọzara, nēfe n'uzọ ada ndim, ọ bughi ifucha afucha, ọ bughi kwa ime ka adi ọcha;


M'gēziga-kwa-ra Babilon ndi ala ọzọ, ndi gāfucha ya; ha gāwusi kwa ala-ya dika miri; n'ihi na ha nọ nēmegide ya buruburu n'ubọchi ihe ọjọ.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, iwem na ọnumam ka anāwusi n'ebe a, n'aru madu, na n'aru anu-ulo, na n'aru osisi ọhia, na n'aru nkpuru nke ala-ubi; ọ gēre kwa ọku, agaghi-emenyu kwa ya.


N'ihi nka ka ha gādi ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu, dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēfechapu n'ebe-nzọcha-ọka, na dika anwuru-ọku si apu na window.


N'ihi na, le, Mu onwem gaje inye iwu, yọchaghari ulo Israel iru na azu n'etiti mba nile, dika esi ayọchaghari ọka nime nyọ, ma ọ dighi otù nkpuru-ọka gāda n'ala.


N'ihi na, le, ubọchi ahu nābia, ọ nēre dika ite-ọku uku; ndi-nganga nile na onye ọ bula nke nēme ihe-nmebi-iwu gābu kwa ahihia-ọka: ubọchi ahu nke nābia gērechapu ha, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ọ gaghi-arapu-kwa-ra ha nkpọrọgwu ma-ọbu alaka.


Rapunu ha abua ka ha nābakọta uba rue owuwe-ihe-ubi: ma n'oge owuwe-ihe-ubi m'gāsi ndi nēwe ihe-ubi, Burunu uzọ chikọta ata ahu, ke kwa ha n'ùkwù ka unu rechapu ha ọku: ma kpokọtanu ọka ahu n'ọba nkem.


Nwa nke madu gēzipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gāchikọputa n'ala-eze-Ya ihe nile nēme ka ama n'ọnyà, na ndi nēme ihe nēmebi iwu,


ha gātubà kwa ha n'oké ọku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.


Mb͕e ahu ka ndi ezi omume gēnwupu dika anyanwu n'ala-eze nke Nna-ha. Onye nwere nti, ya nu.


Jọn zara, si ha nile, Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie; ma Onye kam ike nābia, Onye m'nērughi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:


Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, ifuchapu ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, na ikpokọta ọka-Ya n'ọba-Ya; ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.


Alaka ọ bula nimem nke nādighi-ami nkpuru, O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, O nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o we mia nkpuru kari.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan