Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 28:5 - Bible Nso

5 Ma mọ-ozi ahu zara, si ndinyom ahu, Unu onwe-unu atula egwu: n'ihi na amatawom na unu nāchọ Jisus, Onye akpọgideworo n'obe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ sị ha, “Unu atụla egwu, nʼihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nʼelu obe ka unu na-achọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 28:5
17 Iomraidhean Croise  

Sinu ndi obi-ha nēme ngwa, Dinu ike, unu atula egwu: le, Chineke-unu! ibọ̀-ọ́bọ̀ nābia, bú nkwughachi nke Chineke; Ya onwe-ya gābia zọputa unu.


atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.


Atula egwu, gi idide, bú Jekob, unu ndikom Israel; Mu onwem eyeworo gi aka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ọzọ, Onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel.


O we sim, Atula egwu, Daniel; n'ihi na site n'ubọchi mbu ahu mb͕e i nyere obi-gi ighọta ihe na iweda onwe-gi n'ala n'iru Chineke-gi, anuru okwu-gi nile: mu onwem abiawo kwa n'ihi okwu-gi nile.


O we si, Atula egwu, gi onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku: udo diri gi, di ike, e, di ike. Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we me onwem ka m'di ike, si, Ka onye-nwem kwue; n'ihi na i mewo ka m'di ike.


Ma ngwa ngwa Jisus gwara ha okwu, si, Nwenu obi-ike; ọ bu Mu: unu atula egwu.


Mb͕e ahu Jisus si ha, Unu atula egwu: jenu kọrọ umu-nnam ka ha je Galili, n'ebe ahu ka ha gāhukwam.


site n'egwu ya ndi-nche mara jijiji, bia di ka ndi nwuru anwu.


Ma ọ si ha, Ka ibobo ghara inwu unu n'aru nke-uku: unu nāchọ Jisus, Onye Nazaret, Onye akpọgideworo n'obe: emere ka O si n'ọnwu bilie; Ọ nọghi n'ebe a: le, ebe ha tọb͕ọrọ Ya!


Mọ-ozi ahu we si ya, Atula egwu, Meri: n'ihi na Chineke mere gi amara.


ma mb͕e ha nātu egwu, nērube kwa iru-ha n'ala, ha si ha, Gini mere unu nāchọ Onye di ndu n'etiti ndi nwuru anwu?


Onye Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, mb͕e Ọ tọpusiri ihe-nb͕u nke ọnwu: n'ihi na ọnwu apughi ijide Ya.


Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan