Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 28:19 - Bible Nso

19 Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 28:19
39 Iomraidhean Croise  

Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa.


Biakutenum nso, nurunu nka; site na mb͕e mbu ọ bughi na nzuzo ka M'kwuworo okwu; site na mb͕e ọdidi-ya, n'ebe ahu ka M'nọ: ma ub͕u a Onye-nwe-ayi Jehova ezitewom, mu na Mọ-Ya.


O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.


Jehova ab͕abawo ogwe-aka-Ya di nsọ ọtọ n'anya mba nile; nsọtu nile nke uwa we hu nzọputa nke Chineke-ayi.


O we si ha, N'ihi nka ode-akwukwọ ọ bula nke emere ka ọ buru onye nēso uzọ ala-eze elu-igwe, o yiri madu nke bu nna-nwe-ulo, onye nēsi n'àkù-ya atuputa ihe ọhu na ihe ochie.


ma n'iru Ya ka agēme ka mba nile zukọ: Ọ gēkewaputa kwa ha, otù n'aru ibe-ya, dika onye nāzù aturu nēkewaputa aturu n'umu-ewu:


rue ubọchi anara Ya n'elu, mb͕e O sitere na Mọ Nsọ nyesia ndi-ozi-Ya ndi Ọ rọputarari iwu:


Ma unu gānata ike, mb͕e Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàmnime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu.


Mb͕e ha zisasiri ozi ọma gwa ndi obodo ahu, me kwa ọtutu madu ka ha buru ndi nēso uzọ Jisus, ha laghachi na Listra, na Aikọniọm, na Antiọk,


Ya mere ndi nāra okwu-ya nke-ọma, emere ha baptism: n'ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgu iri.


Ya mere maranu, na nzọputa nka, bú nke Chineke, ka ezigara ndi mba ọzọ: ndi ahu gānu kwa.


Ngwa ngwa ihe dika akpirikpa we si n'anya-ya dapu, eme-kwa-ra ka ọ hu uzọ; o we bilie, eme ya baptism;


Ma asim, Ọ̀ gābu na ha anughi? Ha nuru ezie, N'uwa nile ka olu-ha puru jezue, Na nsọtu nile nke elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue.


N'ihi na asi na ọ dighi otú a, gini ka ha gēme, bú ndi anēme baptism n'ọnọdu ndi nwuru anwu? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie ma-ọli, ọ̀ bu kwa gini mere anēme ha baptism n'ọnọdu ha?


Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile.


N'ihi na ka unu ra, bú ndi emere baptism ibà nime Kraist, unu yikwasiri Kraist.


n'ihi na ayi abua sitere n'aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n'ebe Nna nọ nime otù Mọ Nsọ.


ma asi na ọ bu ezie na unu anọgide n'okwukwe-unu, ndi atọworo ntọ-ala, ndi nēguzosi kwa ike, ndi anādighi-ewepu kwa n'olile-anya nke ozi ọma ahu nke unu nuru, nke ekwusara n'etiti ihe nile ekère èkè nke di n'okpuru elu-igwe; nke emere mu onwem, bú Pọl, onye nēje ozi ya.


bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n'uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, site na nbilite-n'ọnwu nke Jisus Kraist;


Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāb͕a àmà, n'ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan