Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 28:18 - Bible Nso

18 Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n'elu-igwe na n'elu uwa nyem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 28:18
31 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù, Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike; Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu.


Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam, Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ.


Mu ka ndi-eze ji abu eze, Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume.


Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.


N'ezie asim unu, Ufọdu di n'etiti ndi guzoro n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ha gāhu Nwa nke madu ka Ọ nābia n'ala-eze-Ya.


Jisus si ya, Gi onwe-gi kwuru: otú ọ di, asim unu, Site n'ub͕u a unu gāhu Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n'aka-nri nke ike, nābia kwa n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe.


Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mara Onye Ọkpara ahu bu, ma-ọbughi Nna-Ya; na Onye Nna ahu bu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya.


Jisus, ebe Ọ matara na nna-Ya nyere Ya-ri ihe nile n'aka, na O si-kwa-ra n'ebe Chineke nọ puta, nālakuru kwa Chineke,


dika I nyere Ya ike n'ebe madu nile nọ, ka ihe ọ bula I nyeworo Ya, ka O we nye ha ndu ebighi-ebi.


Onye si n'elu bia ka ihe nile elu: onye si n'ala puta nāputa n'ala, si kwa n'ala nēkwu okwu: Onye si n'elu-igwe bia ka ihe nile elu.


Nna nāhu Ọkpara-Ya n'anya, O nyewo kwa Ya ihe nile n'aka.


Okwu nke O zitere umu Israel, nēzisa ozi ọma nke udo site n'ọnu Jisus Kraist (Onye ahu bu Onye-nwe madu nile)


Ya mere ka ulo Israel nile mazue, na Chineke mere Ya ka Ọ buru Onye-nwe-ayi na Kraist-ayi, bú Jisus ahu Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe.


N'ihi na ihe Kraist ji nwua, di kwa ndu ọzọ, bu nka, ka O we buru Onye-nwe ma ndi nwuru anwu ma ndi di ndu.


N'ihi na, Ihe nile ka O doro n'okpuru ukwu-Ya abua. Ma mb͕e ọ bula O gēkwuwori, si, Edowo ihe nile n'okpuru Ya, ọ putara ìhè na Ọ nọghi ya, bú Onye doro ihe nile n'okpuru Ya.


nime Ya ka emezuwo-kwa-ra unu emezu, Onye bu isi nke ibu-onye-isi na ichi-isi nile ọ bula:


Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile;


Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua. N'ihi na na n'ido, ihe nile ahu n'okpuru ya, ọ dighi ihe ọ bula Ọ rapuru nke anēdoghi n'okpuru ya. Ma ub͕u a ayi akāhughi ihe nile ahu na edowo ha n'okpuru ya.


Onye nọ n'aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n'elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n'okpuru Ya.


Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n'ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi.


O nwe-kwa-ra aha edekwasiworo n'elu uwe-Ya na n'elu apata-ukwu-Ya, EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan