Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 27:63 - Bible Nso

63 si, Onye-nwe-ayi, ayi chetara na Onye-nduhie ahu siri, mb͕e Ọ nọ na ndu, Mb͕e ubọchi atọ gasiri M'gēsi n'ọnwu bilie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

63 Ha kwuru sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nʼọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gasịrị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 27:63
18 Iomraidhean Croise  

Site na mb͕e ahu Jisus Kraist malitere igosi ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ ghaghi ije Jerusalem, na ihu ọtutu ahuhu n'aka ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, na aghaghi ib͕u Ya, me kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubochi nke-atọ.


ha gēb͕u kwa Ya, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ. O we wuta ha ri nne.


rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ ka ha me Ya ihe-ọchì, pia Ya ihe, kpọgide Ya n'obe: agēme kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.


si, Nwoke a siri, Apurum ikwatu ulo nsọ a nke Chineke, wu kwa ya n'ubọchi atọ.


Ya mere, nye iwu ka emechie ílì ahu si-ike rue ubọchi nke-atọ, ka ndi nēso uzọ-Ya ghara ibia zuru Ya la ma eleghi anya, we si ndi-Ju, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie: njehie ikpe-azu a gājọ kwa njọ kari nke-mbu.


Ọ nọghi n'ebe a; n'ihi na emere ka O si n'ọnwu bilie, dika O kwuru. Bianu, le ebe Ọ tọb͕ọrọ.


ha gēme kwa Ya ihe-ọchi, busa Ya ọnu-miri, pia Ya ihe, b͕ue Ya: Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.


O we malite izí ha, na Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, na ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, na aghaghi ib͕u Ya, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.


N'ihi na Ọ nēzí ndi nēso uzọ-Ya ihe, si ha, Anārara Nwa nke madu nye n'aka madu, ha gēb͕u kwa Ya; mb͕e eb͕usiri Ya, Ọ gēsi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.


O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya, si ha, Le, ayi nārigoro Jerusalem, ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ site n'aka ndi-amuma gēmezu n'ebe Nwa nke madu nọ.


ha gāpia kwa Ya ihe, b͕ue Ya: n'ubọchi nke-atọ Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie.


Ha we malite ibo Ya ebubo, si, Ayi huru Onye a, ka O nēduhie mba-ayi, nēb͕ochi ha itu ùtú nye Sisa, nāsi kwa na Ya onwe-ya bu Kraist, buru kwa Eze.


si, Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, aghaghi ib͕u kwa Ya, na ime kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.


Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu.


Oké ntamu di kwa n'etiti ìgwè madu nile bayere Ya: ufọdu nāsi, Ọ bu ezi madu; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama Ọ nēduhie ìgwè madu a.


Ya mere ndi-Farisi zara ha, si, Èduhiewo kwa unu onwe-unu?


site n'otuto na ihe-ihere, site na nhota ọjọ na nhota ọma; dika ndi-nduhie, ma ayi bu ndi ezi-okwu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan