Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 27:60 - Bible Nso

60 tọb͕ọ ya n'ílì ọhu nke aka ya, nke o gwuwarari n'oké nkume: o we kpọre otù nkume uku kwachie ọnu-uzọ ílì ahu, we la.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

60 ma gaa lie ya nʼili ọhụrụ nke o gwuuru onwe ya, nʼetiti nkume. O jikwa otu nkume buru ibu kpuchie ọnụ ụzọ ili ahụ, hapụ ya laa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 27:60
12 Iomraidhean Croise  

Nnam merem ka m'ṅua iyi, si, Le, mu onwem gaje inwu: n'ílìm nke m'doziworo onwem n'ala Kenean, n'ebe ahu ka i gēlìm. Ma ugbua, biko, ka m'rigo, lìe nnam, lata.


Gini ka i nwere n'ebe a? ma-ọbu ònye ka i nwere n'ebe a, na i gwuwaworo ílì nye onwe-gi n'ebe a? ọ nēgwuwa ílì-ya n'elu, ọ nākàra onwe-ya ebe-obibi nime nkume di elu!


Ewe me ka ílì-ya di n'etiti ndi nēmebi iwu, ya na ọgaranya nọ kwa n'ọnwu-ya; ọ bu ezie na ọ dighi ihe-ike o mereri, ọ dighi kwa aghughọ di n'ọnu-ya.


Josef we būru aru ahu, ke ya n'ezi ákwà ọcha nēnwu enwu,


Ha we ga, mechie ílì ahu si-ike, n'ika akàrà na nkume ahu, ha na òtù ndi-nche ahu yikọrọ.


Ma le, ala-ọma-jijiji uku dara; n'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi si n'elu-igwe ridata, bia rue, bupu nkume ahu, we nọkwasi ya.


Ha we hu nkume ahu na akpọrepuwo ya n'ílì.


Ya mere Jisus nābiaru ílì ahu nāsu udè ọzọ nime Onwe-ya. Ma ọ bu ọb͕à, otù nkume nātọb͕ọ kwa n'ọnu-ya.


Ya mere ha wepuru nkume ahu. Ma Jisus weliri anya-Ya elu, si, Nna, ekelem I na I nuru olum.


Ma n'ebe akpọgidere Ya N'obe otù ubi ab͕ara ogige di; nime ubi ab͕ara ogige ahu ílì ọhu di kwa nke akātọb͕ọghi madu ọ bula nime ya.


Ma n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa n'isi-ututu, mb͕e chi akābọghi, Meri Magdalini biaruru ílì ahu, we hu nkume-ya na ewepuwo ya n'ílì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan