Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 27:54 - Bible Nso

54 Ma ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, na ndi ha na ya nọ nēche Jisus, mb͕e ha huru ala-ọma-jijiji ahu, na ihe nile emere, ha tua egwu ri nne, si, N'ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

54 Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 27:54
22 Iomraidhean Croise  

Ma Jisus kpuchiri ọnu. Onye-isi-nchu-àjà we si Ya, Ewerem Chineke di ndu b͕a Gi iyí, ka I gwa ayi ma Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke.


ha we nọdu nēche Ya n'ebe ahu.


nāsi kwa, Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ, zọputa Onwe-gi: ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n'elu obe ridata.


Ọ nātukwasi obi-Ya na Chineke; ka Ọ dọputa Ya ub͕u a, ọ buru na Ọ nāchọ Ya: n'ihi na Ọ siri, Abum Ọkpara Chineke.


Ma le, ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke b͕awara iberibe abua site n'elu rue ala; ala ma-kwa-ra jijiji; oké nkume b͕awa-kwa-ra;


Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha.


Mb͕e Ọ batara na Kapanaum, otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise biakutere Ya, nāriọ Ya,


Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nke guzoro nso na ncherita-iru Ya, huru na O kubìri ume otú a, ọ si, N'ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke.


Ha nile si, Gì onwe-gi bu kwa Ọkpara Chineke? Ọ si ha, Unu onwe-unu si na Mu onwem bu Ya.


Ndi-Ju zara ya, si, Ayi onwe-ayi nwere iwu, ma dika iwu ahu si di O kwesiri inwu ọnwu, n'ihi na O mere Onwe-ya Ọkpara Chineke.


Ma otù nwoke nọ na Sisaria, aha-ya bu Kọniliọs, ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke òtù ndi-agha ahu anākpọ òtù Itali,


Ma mb͕e ha nuru nke a, ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi-ozi fọduru, Umu-nna-ayi, gini ka ayi gēme?


Ngwa ngwa o we chiri ndi-agha na ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, we b͕adakwasi ha: mb͕e ha huru onye-isi-ọchi-agha na ndi-agha, ha we rapu iti Pọl ihe.


Pọl we kpọtara onwe-ya otù onye nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Duru nwa-okorọbia nka jekuru onye-isi-ọchi-agha: n'ihi na o nwere ihe ikọrọ ya.


O we kpọtara onwe-ya madu abua nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Dozienu ọgu ndi-agha iri ka ha ga rue Sisaria, na ọgu ndi-inyinya atọ na iri, na ọgu ndi-agha iri nāchi ube, n'oge hour nke-atọ n'abali:


Mb͕e ekpebìri na ayi gābà n'ub͕ọ je Itali, ha we rara Pọl na ufọdu ndi-nkpọrọ ọzọ nye n'aka ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, aha-ya bu Juliọs, nke òtù ndi-agha Ọgustọs.


Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, ebe o nēzube izọputa Pọl, o b͕ochiri ha n'ìzù-ha; we si ka ndi puru igwu miri si n'ub͕ọ tubà onwe-ha na miri, buru uzọ rue ala:


Onye akaworo ibu Ọkpara Chineke n'ike, dika Mọ nke idi-nsọ si di, site na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu; bú Jisus Kraist Onye-nwe-ayi,


N'otù oge hour ahu oké ala-ọma-jijiji we da, otù uzọ n'uzọ iri nke obodo ahu we da rue ala; ewe b͕ue nnù madu iri na nnù asa na ọgu iri nime ala-ọma-jijiji ahu, bú ndi nwere aha: ndi fọduru we tua egwu, ha we nye Chineke nke elu-igwe otuto.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan