Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 27:52 - Bible Nso

52 ílì meghe-kwa-ra; ewe me ka aru ọtutu ndi di nsọ ndi raruri ura si n'ọnwu bilie;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

52 Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 27:52
13 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ha nēli otù nwoke, le, ha huru usu ndi nāpunara madu ihe; ha we tubà nwoke ahu n'ílì Elaisha: nwoke ahu we da, metu ọkpukpu Elaisha aru, we di ndu, bilie guzo n'ukwu-ya abua.


O lodawo ọnwu rue mb͕e ebighi-ebi; Onye-nwe-ayi Jehova gēhichapu kwa anya-miri n'iru nile; ita-uta nke ndi-Ya ka Ọ gēwezuga kwa n'elu uwa nile: n'ihi na Jehova ekwuwo ya.


Ndi-Gi ndi nwuru anwu gādi ndu; ozum nile gēbili. Tetanu, tie nkpu ọṅù, unu ndi bi n'ájá: n'ihi na igirigi nke ìhè nile ka igirigi-Gi bu, ala gāmuputa kwa ndi nādighi ndu.


Ọzọ, ọtutu madu nime ndi nāraru ura n'ala, bú ájá, gēteta, ufọdu ibà na ndu ebighi-ebi, ufọdu ibà n'ita-uta riri nne na oyi agāsọ ha nke-uku mb͕e ebighi-ebi.


N'aka ala-mọ ka M'gēsi b͕aputa ha; n'aka ọnwu ka M'gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari.


Ihe ndia ka O kwuru: mb͕e nka gasiri Ọ si ha, Enyi-ayi Lazarọs adawo n'ura; ma anamaga, ka M'we kpọte ya n'ura.


O we b͕u ikperè n'ala, were kwa oké olu ti nkpu, si, Onye-nwe-ayi, atukwasila nmehie a n'isi-ha. Mb͕e o kwusiri okwu a, o we da n'ura.


N'ihi nka ọtutu madu n'etiti unu adighi ike nāria kwa nriaria, ndi dawo-kwa-ra n'ura nke ọnwu abughi madu ole-na-ole.


Ma otú ọ di, emewo ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie, nkpuru mbu nke ndi daworo n'ura ọnwu.


Le, agwam unu ihe-omimi: Ọ bughi ayi nile gāda n'ura ọnwu, ma agēnwo ayi nile,


N'ihi na asi na ayi kwere na Jisus nwuru si kwa n'ọnwu bilie, otú a ndi emere ka ha da n'ura ọnwu site n'aka Jisus, ọ bu ndia ka Chineke gēkuru ka ha so Ya bia.


Onye nwuru n'ihi ayi, ka ọ gābu, ma ayi nēche nche ma ayi nāraru ura, ka ayi we so Ya dikọ ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan