Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 27:32 - Bible Nso

32 Ma mb͕e ha nāputa, ha huru otù nwoke onye Sairini, aha-ya bu Saimon: onye ahu ka ha jidere ka o so ha, ka o we būru obe-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Mgbe ha na-apụ, ha zutere otu nwoke onye obodo Sirini a na-akpọ Saimọn. Ha manyere ya ka o buru obe ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 27:32
17 Iomraidhean Croise  

me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.


Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.


ọbuná oke-ehi ahu nile ka o gēbupu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū rue ebe di ọcha, rue ikpo-ntu, sure ya n'elu nkú n'ọku: n'elu ikpo-ntu ka agēsure ya ọku.


O gēbupu kwa oke-ehi ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, sure ya ọku dika o surere oke-ehi mbu: àjà-nmehie nke nkpọkọta Israel ka ọ bu.


ọ buru na onye-nchu-àjà etere manu emehie dika ikpe-ọmuma ndim si di; ọ gēweta kwa nso nwa-oke-ehi zuru okè bayere nmehie-ya, nke o mehieworo, ichuru Jehova, ka ọ buru àjà-nmehie.


Mb͕e ahu Jisus siri ndi nēso uzọ-Ya, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam.


Onye ọ bula nke gējide gi ije otù mile, so ya je mile abua.


Ha we jide otù onye nke nāgabiga ka o so ha, ka o we būru obe-Ya, bú Saimon onye Sairini, nna Aleksanda na Rufọs, nke si n'azu obodo ahu bia.


Mb͕e ha nēdupu Ya, ha we jide otù onye, bú Saimon, onye Sairini, nke si n'azu obodo ahu bia, ha we bokwasi ya obe-Ya, ka o buru ya so Jisus.


Ya mere ha kuru Jisus tiyere onwe-ha: O we pua, nēbu obe-Ya n'Onwe-ya, ga rue ebe anākpọ Ebe okpokoro-isi, nke anākpọ n'asusu Hibru Gọlgọta:


Ma ufọdu di n'etiti ha, ndikom nke Saiprọs na Sairini, ndi, mb͕e ha biaruru Antiọk, ha gwa kwa ndi-Grik okwu ahu, nēzisa ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus.


Ma ndi-amuma na ndi-ozizí di n'Antiọk, nime nzukọ Kraist di n'ebe ahu, bú Banabas, na Simeon onye anākpọ Naiga, na Lusiọs onye Sairini, na Manaen onye azùkọrọ ya na Herod, bú tetrarch, na Sọl.


nime Frijia na Pamafilia, nime Ijipt na akuku Libia di Sairini nso, na ndi-ọbìa si na Rom bia, ma ndi-Ju ma ndi nēso uzọ ndi-Ju,


Ma ufọdu biliri n'etiti ndi sitere n'ulo-nzukọ nke anākpọ ulo-nzukọ nke ndi-Libatin, na nke ndi Sairini, na nke ndi Aleksandria, na nke ndi sitere na Silisia na Esia, ha na Stifen nājurita onwe-ha ajuju.


ha we tupu ya n'obodo, tu kwa ya nkume: ndi-àmà we wusa uwe-ha n'ukwu otù nwa-okorọbia anākpọ Sọl.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan