Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 27:31 - Bible Nso

31 Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ahu, yikwasi Ya uwe-Ya nile, dupuga Ya ikpọgide Ya n'obe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya, duuru ya pụọ, ịga kpọgide ya nʼobe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 27:31
12 Iomraidhean Croise  

me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.


Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.


Achiri ya n'ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n'ala, we ghara isaghe ọnu-ya; dika aturu nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya, na dika nne-aturu nke dara ob͕i n'iru ndi nākpacha ya aji; e, ọ dighi-asaghe ọnu-ya.


Jehova we si Moses, Aghaghi ime ka nwoke ahu nwua: nzukọ Israel nile gēwere nkume tub͕ue ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū.


rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ ka ha me Ya ihe-ọchì, pia Ya ihe, kpọgide Ya n'obe: agēme kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.


Ha we jide ya, tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya.


Unu matara na mb͕e ubọchi abua gasiri ememe ngabiga nābia, arara kwa Nwa nke madu nye ka akpọgide Ya n'obe.


Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ododo ahu, we yikwasi Ya uwe-Ya nile. Ha we dupu Ya ka ha kpọgide Ya n'obe.


Ya mere mb͕e ahu ọ rara Ya nye n'aka-ha, ka ewe kpọgide Ya n'obe.


Mb͕e ahu Ọ si onye ahu nke nēso uzọ-Ya, Le, nne-gi! Site n'oge hour ahu onye ahu nke nēso uzọ-Ya we kuru ya la n'ulo nke aka ya.


ha we tupu ya n'obodo, tu kwa ya nkume: ndi-àmà we wusa uwe-ha n'ukwu otù nwa-okorọbia anākpọ Sọl.


N'ihi nka Jisus, ka O we site n'ọbara nke Ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n'azu ọnu-uzọ-ama nke obodo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan