Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 27:3 - Bible Nso

3 Mb͕e ahu Judas, onye rara Ya nye, mb͕e ọ huru na amara Ya ikpé, ọ kwa uta, chighachi orú ego ọla-ọcha na iri ahu nye ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 27:3
15 Iomraidhean Croise  

Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu, Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?


Ọ buru na orù-nwoke ma-ọbu orù-nwayi ka ehi ahu sọrọ mpì; orú shekel ọla-ọcha na iri ka ọ gēnye onye-nwe-ya, agātub͕u kwa ehi ahu.


Jehova we sim, Tufue ya nye ọkpu-ite, bú ọnu-ahia mab͕uru onwe-ya nke ha rùrum. M'we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, tufue ha nye ọkpu-ite, n'ulo Jehova.


Mb͕e ha nēri nri-anyasi, mb͕e ekwensu tinyesiri ub͕u a n'obi Judas Iskariot, nwa Saimon, ka ọ rara Ya nye,


Mb͕e enyesiri ya iberibe achicha ahu, mb͕e ahu Setan batara nime onye ahu. Ya mere Jisus si ya, Ihe i nēme, me ya ọsọsọ.


Ya mere Judas, ebe ọ natara òtù ndi-agha, na ndi nēje ozi site n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi, ọ chiri oriọna na ọwa na ihe-agha bia n'ebe ahu.


(Ya mere onye a sitere n'ugwọ-ọlu nke ajọ omume-ya nata otù iberibe ala; o we da su isi n'ala, tipue afọ-ya, ngiri-afọ-ya nile we nuputa.


N'ihi na nwuta dika Chineke chọrọ nālu ọlu nchèghari rue nzọputa, bú nchèghari nke anāpughi ikwa uta bayere ya: ma nwuta nke uwa nāluputa ọnwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan