Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 27:2 - Bible Nso

2 ha we ke Ya ab͕u, dupu Ya, rara Ya nye n'aka Pailat onye-isi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya pụọ, nyefee ya nʼaka Pailet onye bụ gọvanọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 27:2
25 Iomraidhean Croise  

Ha biarue ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je; Abraham we wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, do nkú ahu n'usoro, ke Aisak, bú nwa-ya nwoke, ab͕ú, tukwasi ya n'elu ebe-ichu-àjà, n'elu nku.


rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ ka ha me Ya ihe-ọchì, pia Ya ihe, kpọgide Ya n'obe: agēme kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.


Ọ buru kwa na nka ruru nti onye-isi, ayi onwe-ayi gārafu ya, me ka unu ghara icheb͕u onwe-unu.


Ma ufọdu nọ n'ebe ahu n'oge ahu ndi kọrọ Ya akukọ bayere ndi Galili ahu, ndi Pailat were ọbara-ha gwakọta n'àjà-ha.


Ha we che Ya nche, we zipu ndi-nledo, ndi mere onwe-ha dika ndi ezi omume, ka ha we jide Ya n'okwu-ọnu-Ya, irara Ya nye n'aka ọchichi na ike nke onye-isi.


Ọra ndi ahu nile we bilie, duru Ya je n'iru Pailat.


Herod na Pailat we me eyì n'etiti onwe-ha n'ubọchi ahu: n'ihi na n'oge gara aga ha bu ndi-iro.


Ma n'arọ nke-iri-na-ise n'ọchichi nke Taibiriọs Sisa, mb͕e Pọntiọs Pailat bu onye nāchi Judia, mb͕e Herod bu kwa tetrarch nke Galili, mb͕e nwa-nne-ya Filip bu kwa tetrarch nke ala Ituria na Trakonaitis, mb͕e Lisanias bu kwa tetrarch nke Abilini,


Ya mere òtù ndi-agha ahu na ọchi-agha, na ndi nējere ndi-Ju ozi, jidere Jisus ke kwa Ya ab͕u,


Ya mere Anas zigara Ya n'ab͕u jekuru Kaiafas onye-isi-nchu-àjà.


Ya mere ha si na nke Kaiafas duru Jisus ba na Pritoriọm: ọ bu kwa n'isi-ututu; ma ha onwe-ha abàghi nime Pritoriọm ahu, ka aghara imeru ha, kama ka ha we rie oriri ngabiga.


Ma mb͕e Herod gaje ikuputa ya, n'otù abali ahu Pita nāraru ura n'etiti ndi-agha abua, eji nkpọrọ abua ke ya ab͕u: ndi-nche ndi nọ n'iru ọnu-uzọ nēchebe ulo-nkpọrọ.


Mb͕e ahu onye-isi-ọchi-agha biaruru nso, jide ya, si ka ewere nkpọrọ abua ke ya; ọ ju-kwa-ra onye ọ bu, na ihe o mereri.


Ma mb͕e ha chiri udọ̀-akpukpọ kesia ya, Pọl siri ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke guzoro n'ebe ahu, Ò ziri ezi n'iwu ka unu pia madu bu onye Rom ihe, nke bu kwa onye anāmaghi ikpé?


Ya mere ndi gaje ichọputa isi okwu n'ọnu-ya si n'ebe ọ nọ pua ngwa ngwa: onye-isi-ọchi-agha we tu kwa egwu, mb͕e ọ matara na ọ bu onye Rom, na n'ihi na o kere ya-ri ab͕u.


Ma mb͕e arọ abua b͕azuru, Pọsiọs Festọs nọchiri ọnọdu Filiks; ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n'ebe ndi-Ju nọ, Filiks we rapu Pọl n'ab͕u.


Ya mere n'ihi ihe nka ka m'riọrọ unu ka m'hu unu anya gwa kwa unu okwu: n'ihi na ọ bu n'ihi olile-anya nke Israel ka ekerem nkpọrọ a


Chineke nke Abraham, na nke Aisak, na nke Jekob, Chineke nke nna-ayi-hà, nyere Onye ahu nējere Ya ozi otuto, bù Jisus; Onye unu onwe-unu rara nye, gọnari kwa n'iru Pailat, mb͕e o kpereri ikpè irapu Ya.


n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi,


riọ akwukwọ-ozi n'aka-ya igaru Damaskọs inye ndi ulo-nzukọ, ka ọ gābu, ma asi na ọ chọtara ndi ọ bula di n'Uzọ a, ma-ọbu ndikom ma-ọbu ndinyom, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u bia Jerusalem.


Anamenye gi iwu n'iru Chineke, Onye nēme ka ihe nile di ndu, ya na n'iru Kraist Jisus, Onye b͕ara àmà nkwuputa ọma ahu n'iru Pọntiọs Pailat;


nke m'nāhuju anya nime ya rue ab͕u, dika onye nālu ọlu ọjọ; ma ekeghi okwu Chineke ab͕u.


Nēchetanu ndi nọ n'ab͕u, dika ndi ekekọworo unu na ha n'ab͕u; nēchetanu ndi anēmejọ, dika ndi unu onwe-unu nọ kwa n'aru.


Ha si ya, Ike gi ab͕u ka ayi ridataworo, inye gi n'aka ndi Filistia. Samson we si ha, Ṅuaranum iyi, ka unu we ghara idakwasim, unu onwe-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan