13 Mb͕e ahu Pailat si Ya, Ì nughi ka ọtutu ihe ha nāb͕a àmà megide Gi ra?
13 Ya mere, Pailet sịrị ya, “Ị naghị anụ ihe ndị a niile ha na-ebo gị?”
Onye-isi-nchu-àjà we bilie, si Ya, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi?
Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nēbo Ya ebubo, Ọ zaghi ihe ọ bula.
Ma Ọ zaghi ya, ọbuná rue otù okwu: ya mere na o juru onye-isi ahu anya nke-uku.
Pailat zara, si, Mù onwem bu onye-Ju? Mba nke Gi na ndi-isi-nchu-àjà rara Gi nye n'akam: gini ka I mere?
onye-isi-ọchi-agha we si ka ekuru ya bata n'ulo ndi-agha, ọ gwa ha ka ewere ipia-ihe chọputa isi okwu n'ọnu-ya, ka o we mazu ihe mere ha ji ti nkpu megide ya otú a.