Achiri ya n'ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n'ala, we ghara isaghe ọnu-ya; dika aturu nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya, na dika nne-aturu nke dara ob͕i n'iru ndi nākpacha ya aji; e, ọ dighi-asaghe ọnu-ya.
Ma ibe ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke ọ nāgu bu nka, Esekpuru Ya, dika aturu, je ob͕ub͕u; Dika nwa-aturu da-kwa-ra ob͕i n'iru onye nākpacha ya aji, Otú a ka Ọ nādighi-asaghe ọnu-Ya: