Ma ònye ka i cheb͕uworo onwe-gi bayere ya, we tua egwu ya, na i nēkwu okwu-ugha, we ghara ichetam, ghara kwa itiye ya n'obi-gi? Mù onwem adighi-ab͕a nkiti ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, i we ghara itu egwum?
Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.