Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 25:43 - Bible Nso

43 abum ọbìa, ma unu akpọbataghm; ab͕aram ọtọ, ma unu eb͕okwasighm ákwà; aru adighm ike, anọkwam n'ulo-nkpọrọ, ma unu eletaghm.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

43 Mgbe m nọ dị ka ọbịa, unu akpọbataghị m nʼụlọ unu. Mgbe m gba ọtọ, unu enyeghị m uwe. Mgbe ahụ na-esighị m ike, unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nʼụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 25:43
10 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na ahum madu nāla n'iyì site n'enweghi uwe, Ọ buru kwa na ob͕eye enweghi ákwà-nb͕okwasi;


N'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a megide ndi-ọzùzù-aturu ndi nāzù ndim dika aturu, si: Unu onwe-unu akpasawo ìgwè ewu na aturu nkem, chusa ha, unu elekọtaghi kwa ha; le, M'gaje iwere ihe ọjọ nke omume nile unu leta unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ndi ala nka emeb͕uwo emeb͕u, punara madu ihe n'ike; onye ewedara n'ala na ob͕eye ka ha meworo ihe-ike, ọ bu kwa ọbìa ka ha meb͕uworo n'ekpeghi ikpe.


ab͕aram ọtọ, unu we b͕okwasim ákwà: aru adighm ike, unu we letam: anọm n'ulo-nkpọrọ, unu we biakutem.


n'ihi na agu gurum, ma unu enyeghm ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, ma unu ekughi miri nyem:


Mb͕e ahu ndi ahu gāza kwa, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ma-ọbu ka I bu ọbìa, ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ma-ọbu ka aru nādighi Gi ike, ma-ọbu ka I nọ n'ulo-nkpọrọ, ma ayi ejereghi Gi ozi?


Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Pọl we si Banabas, Ka ayi jeghachi ub͕u a leta umu-nna-ayi n'obodo nile n'otù n'otù ebe ayi kwusara okwu Onye-nwe-ayi, ka ayi we le otú ha nēme.


Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama.


Nēchetanu ndi nọ n'ab͕u, dika ndi ekekọworo unu na ha n'ab͕u; nēchetanu ndi anēmejọ, dika ndi unu onwe-unu nọ kwa n'aru.


Ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, ibà inọ ọnọdu-abali na Gibea: ọ ba, nọdu n'amá obodo ahu: ma ọ dighi nwoke nāchikọta ha ba n'ulo-ya inọ ọnọdu-abali.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan