Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 25:32 - Bible Nso

32 ma n'iru Ya ka agēme ka mba nile zukọ: Ọ gēkewaputa kwa ha, otù n'aru ibe-ya, dika onye nāzù aturu nēkewaputa aturu n'umu-ewu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Mba niile nke ụwa ga-ezukọtakwa nʼihu ya. Ọ ga-ekewapụta ha, otu obodo site nʼibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ sị ekewapụta ụmụ atụrụ site nʼụmụ ewu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 25:32
22 Iomraidhean Croise  

N'ihi nka ndi nēmebi iwu agaghi-eguzosi ike n'ikpé, Ndi-nmehie agaghi-eguzosi kwa ike na nzukọ ndi ezi omume.


O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu, Ọ nēdu kwa ha n'ozara dika ìgwè aturu.


N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo; N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēji ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēji kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Ya kpe ndi nile di iche iche ikpe.


N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe: Ọ gēwere ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe, Ọ gēwere kwa izi-ezi kpe ndi nile di iche iche.


M'gāsachapu kwa ndi nānupu isi na ndi nējehie megidem n'etiti unu; n'ala ebe ha nọ dika ọbìa ka M'gēme ka ha si puta, ma ọ bughi n'ala Israel ka ha gābà: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Unu gālaghachi kwa hu ihe di iche n'etiti onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'etiti onye nēfè Chineke na onye nādighi-efè Ya.


Otú a ka ọ gādi n'ọgwugwu oge a: ndi-mọ-ozi gāputa, kewaputa ndi bu ajọ madu n'etiti ndi ezi omume,


Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ:


Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, Ọ gāfuchapu kwa ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, Ọ gēkpokọta kwa ọka-Ya n'ọba-Ya, ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.


Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma; ama-kwa-ram aturu nkem, aturu nkem ma-kwa-ram,


Aturu nkem nānu olum, Mu onwem ma-kwa-ra ha, ha nēsokwam:


N'ihi na ka ha ra, bú ndi mehiere nēnweghi iwu, ha gāla kwa n'iyì nēnweghi iwu: ka ha ra kwa, bú ndi mehiere n'okpuru iwu, agēsite n'iwu kpe ha ikpé;


n'ubọchi ahu mb͕e Chineke gēkpe ihe-nzuzo nile nke madu nile, dika ozi ọma m si di, site n'aka Jisus Kraist.


Ya mere, unu ekpela ihe ọ bula ikpé mb͕e oge ahu akērughi, rue mb͕e ọ bula Onye-nwe-ayi gābia, Onye gēweputa kwa ihe nile ezoro ezo nke ọchichiri n'ìhè, me kwa ka ìzù nile nke obi nile puta ìhè; mb͕e ahu ka madu nile n'otù n'otù gēnwe kwa otuto-ha site n'aka Chineke.


N'ihi na aghaghi ime ka ayi nile puta ìhè n'iru oche-ikpé Kraist; ka ayi nile n'otù n'otù we nāghachi íhe esitere n'aru me, dika ihe onye ọ bula mere si di, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma.


Agētipia ndi nāchọ Jehova okwu; Ọ gāmakwasi ha éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe: Jehova gēkpe nsọtu nile nke uwa ikpe; Ọ gēnye kwa eze-Ya ike, Me kwa mpi onye-Ya etere manu ka ọ di elu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan