Ma Mu ka ha nāchọ kwa-ubọchi, imara uzọm nile nātọ kwa ha utọ: dika mba nke mere ezi omume, nke nārapughi kwa ikpé nke Chineke-ha, ha nāriọm ikpé nile nke ezi omume, ibiaru Chineke nso nātọ ha utọ.
nēle-kwa-nu anya nke-ọma, ma ọ di onye ọ bula nke nērughi amara Chineke; ka nkpọrọgwụ ilu obula we ghara ipuputa we sob͕ue unu; ewe were nkpọrọgwụ ahu meru ọra madu;
Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Sadis akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nwere Mọ asa ahu nke Chineke, na kpakpando asa ahu: Amataram, ọlu-gi nile, na i nwere aha na i di ndu, ma i bu onye nwuru anwu.