Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 25:10 - Bible Nso

10 Ma mb͕e ha nēje izú, onye nālu nwunye ọhu biara; ndi edoziworo we so ya ba n'oriri ọlulu-nwunye: ewe mechie uzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 25:10
21 Iomraidhean Croise  

Ndi nāba n'ub͕ọ bara oke na nwunye sitere n'anu-aru nile, dika Chineke nyere ya iwu: Jehova we mechibido ya uzọ nime.


N'ihi ya aṅurum iyi n'iwem, si, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli


Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi ubọchi Onye-nwe-unu gābia.


Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge nche onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-ekwe kwa ka egwupú ulo-ya.


N'ihi nka unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.


Ma n'etiti abali iti-nkpu dara, Le, onye nālu nwunye ọhu! Putanu izute ya.


Ọ bughi onye ọ bula nke nāsim, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, gābà n'ala eze elu-igwe; kama ọ bu onye nēme ihe Nnam Nke bi n'elu-igwe nāchọ.


Ka eke unu ihe-ọkiké n'úkwù, ka oriọna-unu nēnwu kwa;


Mb͕e Nna-nwe-ulo gēbiliwori, mechi kwa uzọ-Ya, unu we malite iguzo n'èzí, na iku aka n'ọnu-uzọ ahu, si Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ; ma Ọ gāza, si unu, Amataghim unu, ebe unu si bia;


nēkele Nna-ayi, Onye mere ka ayi rue iketa òkè-ayi n'ihe-nketa ndi nsọ n'ìhè;


nke fọduru bu na edebeworom okpu-eze nke ezi omume ahu, nke Onye-nwe-ayi, bú Onye ezi omume n'ikpe ikpé, gēnyeghachim n'ubọchi ahu: ma ọ bughi nání mu onwem, kama Ọ gēnyeghachi kwa ndi nile huworo ngosi-Ya n'anya.


N'ihi nka kenu ihe-ọkiké a n'úkwù nke uche-unu, nwe-kwa-nu anya-udo, lezu-kwa-nu anya okè n'amara nke anēwetara unu nime nkpughe nke Jisus Kraist;


Le, Ọ nābia, Ya na igwe-oji; anya nile ọ bula gāhuzu kwa Ya, ndi ahu gāhu kwa Ya, bú ndi mara Ya ube; ebo nile nke uwa gēti-kwa-ra ya aka n'obi. E, Amen.


Ka ayi ṅuria ọṅu, ka obi nātọ kwa ayi utọ nke-uku, ka ayi were kwa otuto nile nye Ya: n'ihi na ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu abiawo, nwunye-Ya edoziwo kwa onwe-ya.


Onye ahu Nke nāb͕a àmà ndia nāsi, E: anamabia ọsọsọ. Amen: bia, Onye-nwe-ayi Jisus.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan