Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 24:9 - Bible Nso

9 Mb͕e ahu ka ha gārara unu nye na nkpab͕u, ha gēb͕u kwa unu: mba nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Mgbe ahụ ha ga-arara unu nyefee nʼaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbukwa unu. Mba niile ga-akpọ unu asị nʼihi m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 24:9
26 Iomraidhean Croise  

Ihe-árú n'anya ndi ezi omume ka onye ajọ omume bu: Ọzọ, ihe-árú n'anya onye nēmebi iwu ka onye ziri ezi n'uzọ-ya bu.


Ọzọ, ndi nwere uche n'etiti ndi Chineke gēme ka ọra madu ghọta ihe: ma ha gāsu ngọngọ site na mma'agha, site kwa n'ire-ọku, site kwa na ndọta-n'agha, site kwa na nluta-n'agha, ọtutu ubọchi.


ma ndi fọduru jidere ndi-orù-ya, me ha ihe-ihere, b͕u kwa ha.


N'ihi nka, le, Mu onwem nēzitere unu ndi-amuma, na ndi-amam-ihe, na ndi-ode-akwukwọ: ufọdu nime ha ka unu gēb͕u, kpọgide kwa ha n'obe; ufọdu nime ha ka unu gāpia kwa ihe n'ulo-nzukọ-unu, si kwa n'otù obodo nēsob͕u ha ga obodo ọzọ:


N'ihi nka amam-ihe Chineke kwu-kwa-ra, si, M'gēzigara ha ndi-amuma na ndi-ozi; ufọdu nime ha ka ha gēb͕u kwa sob͕u kwa;


Ma mb͕e ihe ndia nile akēmeghi, ha gātukwasi unu aka-ha, sob͕u kwa unu, nārara unu nye n'aka ulo-nzukọ na ulo-nkpọrọ, n'ebe anēduputa unu ga n'iru ndi-eze na ndi-isi n'ihi aham.


Ọ buru na uwa akpọ unu asì, unu mara na ọ kpọwo Mu onwem asì mb͕e ọ kākpọghi unu asì.


Ma ihe ndia nile ka ha gēme unu n'ihi aham, n'ihi na ha amataghi Onye ziterem.


Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.


Ma ọ di ayi nma inu n'ọnu-gi ihe i tukwasiri uche-gi na ha: n'ihi na ihe bayere irọ-òtù a, ayi mazuru na anēkwugide ya ebe nile.


Ha we tua Stifen nkume, ka ọ nākpọku Onye-nwe-ayi, nāsi, Onye-nwe-ayi Jisus, nara mọm nke-ọma.


ma ọ buru na onye ọ bula nāhu ahuhu dika Kristian, ka ihere ghara ime ya; ma ka o nye Chineke otuto n'aha nka.


Atula ahuhu nile i gaje ihu egwu: le, ekwensu gaje itubà ufọdu n'etiti unu nime ulo-nkpọrọ, ka ewe nwa unu; unu gēnwe kwa nkpab͕u ubọchi iri. Gosi onwe-gi onye kwesiri ntukwasi-obi rue ọnwu, M'gēnye kwa gi okpu-eze ahu, bú ndu.


Amataram ebe i bi, bú ebe oche-eze Setan di: i nējidesi kwa aham ike, i gọnarighi kwa okwukwem, ọbuná n'ubọchi Antipas onye-àmàm, onye nkem kwesiri ntukwasi-obi, onye eb͕uru n'etiti unu, ebe Setan bi.


M'we si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi matara. O we sim, Ndia bu ndi nēsi n'oké nkpab͕u ahu puta, ha sa-kwa-ra uwe-nwuda-ha, me kwa ka ha di ọcha nime ọbara Nwa-aturu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan