Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 24:8 - Bible Nso

8 Ma ihe ndia nile bu nmalite ihe-nb͕u.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 24:8
12 Iomraidhean Croise  

Ọ bu nání na ọ makpuworo n'ọnọdu onye-nkpọrọ, ọ bu kwa n'ọnọdu ndi eb͕uru eb͕u ka ha gāda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Siria site n'Iru-anyanwu, na ndi Filistia site n'Ọdida-anyanwu; ha nēwere kwa ọnu nile richapu Israel. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


N'ihi nka Onye-nwe-ayi agaghi-aṅuri ọṅu n'aru umu-okorọbia-ha, Ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru umu-nb͕ei-ha na ndinyom-ha di-ha nwuru: n'ihi na onye ọ bula nime ha bu onye emeruru emeru na onye nēme ihe ọjọ, ọnu ọ bula nēkwu kwa ihe-nzuzu. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Manase gēmegide Efraim, Efraim gēmegide kwa Manase: ndi ahu abua gēmegide Juda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Ihe-nb͕u nile nke nwanyi ime nēme gābiakute ya: ya onwe-ya bu nwa nāmaghi ihe; mb͕e oge eruwo ọ dighi-eguzo n'ebe ib͕ọwaputa umu.


N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: ala-ọma-jijiji gādi n'ebe di iche iche; oké unwu di iche iche gādi: ihe ndia bu nmalite ihe-nb͕u.


Ma mb͕e ihe ndia nile akēmeghi, ha gātukwasi unu aka-ha, sob͕u kwa unu, nārara unu nye n'aka ulo-nzukọ na ulo-nkpọrọ, n'ebe anēduputa unu ga n'iru ndi-eze na ndi-isi n'ihi aham.


Jehova gēme kwa ka ihe-otiti-gi nile na ihe-otiti nile nke nkpuru-gi di ebube, ha gābu ihe-otiti uku, nke nānọgide kwa anọgide, na ọria ọjọ, nke nānọgide kwa anọgide.


Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.


Genu nti, unu ndi-ọgaranya, kwa ákwá, ti-kwa-nu nkpu n'ihi ihuju-anya nile unu nke nābiakwasi unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan