Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Matiu 24:42 - Bible Nso

42 Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi ubọchi Onye-nwe-unu gābia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

42 “Nʼihi nke a, na-echenụ nche, nʼihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Matiu 24:42
17 Iomraidhean Croise  

Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi na oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amataghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara.


Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge nche onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-ekwe kwa ka egwupú ulo-ya.


N'ihi nka unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.


Ma mb͕e ha nēje izú, onye nālu nwunye ọhu biara; ndi edoziworo we so ya ba n'oriri ọlulu-nwunye: ewe mechie uzọ.


Ya mere, nēchenu nche, n'ihi na unu amataghi ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu.


Ma nēzenu onwe-unu, ka aghara iwere imebiga-ajọ-ihe-ókè, na iṅubiga-manya-ókè, na ncheb͕u nke ndu a, bob͕u obi-unu ma eleghi anya, ubọchi ahu we biakwasi unu na mberede dika ọnyà;


Ma murunu anya n'oge ọ bula, nāriọ aririọ, ka unu we nwe ike ib͕anari ihe nile ndia nke gaje ime, na iguzo n'iru Nwa nke madu.


Nke ahu kwa, ebe unu matara oge a, na oge hour eruwo ub͕u a ka unu teta n'ura: n'ihi na ub͕u a nzọputa-ayi di nso kari mb͕e ayi kwere na mbu.


Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.


ya mere otú a, ka ayi ghara iraru ura, dika ndi fọduru, kama ka ayi nēche nche nwe kwa anya-udo.


Ma ọgwugwu ihe nile di nsọ: ya mere nwenu uche zuru okè, nwe-kwa-nu anya-udo ka unu we kpe ekpere:


Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:


(Le, anamabia dika onye-ori. Ngọzi nādiri onye nēche nche, nēdebe kwa uwe-ya, ka ọ ghara ijeghari n'ọtọ, ha we hu ihere-ya.)


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan